Onye gburu Onyebuchi Rita?

Aha onyonyo, Onye gburu Onyebuchi Rita?

Nwaada Onyebuchi Rita lụrụ di n'ọnwa Jenụwarị afọ a.

Mana ka mkpụrụ ọnwa abụọ gachara, oke isi si n'ụlọ ha mere ndị agbataobi ha jiri kpọkuo ndị uweojii ndị hụrụ ya n'ọnwụ n'ụlọ ha n'Amawbia dị n'Anambra steeti n'ọnọdụ a ka na-enyo enyo.

N' ọgbakọ Facebook ka akụkọ malitere ifegharị etu e si hụ ozu nwaada a n'ime ụlọ ha.

Dịka nwanne ya nwoke si kọrọ BBC Igbo, ozu Rita amalitela ire ure oge ha hụrụ ya.

Tupu ha hụ ya, ha achọọla ya abalị atọ, na-akpọ ekwentị ya mana ọ zaghị.

Ndị uweojii nwuchiri di ya bụ Ikechukwu Atansi, onye kwuru na ya amaghị ihe mere nwunye ya.

Gere akụkọ ahụ n'uju n'ihe nkiri dị n'elu: