Coronavirus: Ndụmọdụ ụmụ afọ Igbo nọ Chaịna na-enye ndị Naịjirịa maka nje a

A na-ekwu na ọ bụ Chaina ka coronavirus si, ma na-ekwukwa na ọ bụ mba ahụ kachasi mara etu e si ebuso ha bụ nje agha.

Ụmụafọ Igbo abụọ na-agụ mahadum na mba ahụ kowara ihe ha hụrụ ma nyekwa ndị nọ Naịjirịa ndụmọdụ etu ha ga-ejiri mgbochie mbanwanye nje a.