Igbo funeral rites: Usoro e ji eli nwaanyị n'ala Igbo

    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo

Ndị Igbo na-ahụta ọnwụ mmadụ dịka mmebi nke anụahụ na ọ bụghị mmebi nke mmụọ dịka ha kwenyere na mmụọ onye ahụ ga na-anọ n'etiti ha n'oge niile.

Ọ bụrụ na mmadụ nwụọ, ihe dịrị ndị ezinaụlọ ya bụ ili ya nke ọma iji kwanyere onye ahụ ugwu nke ikpeazụ.

Nwaanyị nwụọ n'ala Igbo e nwere usoro omenala ndị a ga-agbaso iji hụ na e liri nwaanyị ahụ nke ọma ebe mkpụrụobi ya ga-ezu ike.

Ụdịrị ọnwụ ọ nwụrụ ga-abụ ihe ga-egosi etu a ga-esi lie ya.

Ọ bụrụ na ọ nwụrụ 'ajọnwụ' dịka etozughi oke, amụghị ụmụ, ọ nwụrụ n'ụbịam, n'ihe mberede maọbụ na aka mmadụ dị n'ọnwụ ya, dgz, a gaghị e me oke emume n'ili onye ahụ.

Mana ọ bụrụ na nwaanyị ahụ nwụrụ 'ọnwụchi' dịka itozuoke nwaanyị, nwee ụmụaka, kaa nka, olili ya ga-ejupụta n'oriri, ọṅụṅụ nakwa nkwari.

Akụkọ a ga-eleba anya n'usoro e ji eli nwaanyị tozuruoke ( lụrụ di, mụọ ụmụ, kaa nka) tupu oge ọnwụ ya.

A bịa n'ala Igbo a na-ahụ nwaanyị lụrụ di dịka onye nwere ezinaụlọ maọbụ obodo abụọ; obodo ebe a mụrụ ya na obodo ebe a lụrụ ya.

BBC Igbo tulere usoro dị iche iche e ji eli nwaanyị n'ụfọdụ steeti ndị mejupụtara ala Igbo nke gụnyere Abia, Anambra, Imo, Enugwu na Ebonyi.

Abia Steeti

Otu onye ọdịnala bụ Maazị Kalu Okorie Uzu kọwara na ọ bụrụ na nwaanyị nwụọ, na ihe mbụ ezinaụlọ ebe a lụrụ ya (ụmụ ya na di ya) ga-eme bụ ị ga gwa ezinaụlọ ebe a mụrụ ya na nwa ha nwaanyị anwụọla.

Ha ga-eji mmanya, ọji na ihe ndị ọzọ gaa mee ka ndị ọgọ ha mara. Dịka ha mechara nke a, ezinaụlọ ebe a lụrụ ya ga-anọkọ kpaa maka mgbe a ga-eli ya.

Ọ bụrụ na ha kpebie oge a ga-eli nwaanyị ahụ, ha ga-alaghachị n'ezinaụlọ a mụrụ ya ma mee ka ha mata maka ụbọchị ahụ.

Ezinaụlọ ebe a mụrụ nwaanyị ahụ ga-agụpụta ihe niile ha chọrọ ka ndị ọgọ ha nye ha , nke gụnyere mmanya, ọjị, nri, ụfọdụ na-asi ka e gbuoro ha ewu, atụrụ, ehi nakwa ihe ndị ọzọ.

N'ọge olili ya, ezinaụlọ ebe a mụrụ ya ga-eji onyinye dị iche iche ha ji 'akwa ozu' nwa ha nwaanyị gaa n'ebe ndị ọgọ ha maka olili nwaanyị ahụ.

Anambra

Nwaanyị nwụọ, ndị ezinaụlọ a lụrụ (ụmụ ya na di ya) ga-eji mmanya, ọji gaa mee ka ndị mụrụ ya mara.

Ihe mbụ ndị mụrụ ya na-eme dịka ha nụrụ ozi ọnwụ ya bụ na onyeisi ezinaụlọ ga-egbu ọkụkọ ma tụọ aja tupu ha gawa ịhụ ozu nwa ha nwaanyị.

Dịka ha hụchara ozu nwaanyị ahụ, ha ga-agwa ndị lụrụ ihe ole na ole a chọrọ n'aka ha, gụnyere ewu, ọkụkọ, akwa, nzụ, nakwa mmanụ otite.

Ọ bụrụ na oge ili nwaanyị ahụ ruo ezinaụlọ mụrụ ya ga-atụkwa aja n'isi tupu ndị lụrụ elie ya dịka omenala ha si dị.

Ebonyi Steeti

Odoziakụ Mercy Egwu sị na nwaanyị nwụọ, na ụmụ ya ga-eji mmanya na ọjị ga mee ka ndị ikwu ya mara na nwa ha nwaanyị anwụọla.

Ndị ikwunne ha ahụ ga-abịara ụmụ nwaanyị ahụ mgbaru ma soro ha rie uju maka ọnwụ nne ya bụ nwa ha nwaanyị.

Ezinaụlọ abụọ ndị a ga-abịa dorita isi iji ịmata ụbọchị ụmụ nwaanyị ahụ ga-achọ ili ya.

N'ụbọchị olili nwaanyị ahụ, ụmụ ya nwereike iji ehi, ewu maọbụ ọkụkọ nye ndị ikwunne ha ebe ndị ikwunne ha ga-enyekwa ha onyinye dịka nri, ọjị, mmanya n'ịbịara ha olili nne ha.

A gaghị edosa ozu nwaanyị ahụ n'ihu ama (ogo), a gaghị esi n'ihu ezi kama a ga-esi n'azụ ụlọ buba ya n'ime ụlọ.

Enugwu Steeti

Nwaada Blessing Ada Ifeanyi sị na ọ bụrụ na Nwaanyị ọkachasị onye bụ Ada nwụọ na ụmụaka ya ga-eji mmanya, ọjị na ihe ndị ọzọ gaa ebe a mụrụ nwaanyị iji mee ka ha mara na ọ nwụọla.

Dịka ha mere nke a, ndị ikwu nne ga-ekunye ha mmiri ọṅụṅụ iji gosi nnabata ozi ahụ nakwa inye ụmụaka ya ikike iri nri n'ụlọ ebe a mụrụ nne ha.

A bịa n'ihiwe ụbọchị a ga-eli nwaanyị, ọ bụ ezinaụlọ mụrụ nakwa ezinaụlọ ebe a lụrụ ga-anọkọ iji hiwe mgbe ga-amasị ha ili nwaanyị a.

Ọ sị na ọ bụrụ na e soghi usoro ndị a, na mmụọ nwaanyị ahụ ga-aga n'akpa ike dị egwu n'ezinaụlọ ebe a mụrụ ya.

N'oge olili ya, ndị mụrụ ga-azụta akwa, ọjị, mmanya dgz gaa ịkwa ozu nwa ha nwaanyị n'ebe a lụrụ ya nke a kpọrọ 'ụlọakwa'.

Ezinaụlọ ebe a lụrụ nwaanyị ahụ ga-anabata onyinye ndị si n'aka ndị ọgọ ha ma nyeghachị ha, tinyekwara ihe ọzọ a ga-achọ n'aka ha.

Imo Steeti

Dịka oriakụ Margaret Okere sị kọwaa, ọ bụrụ na nwaanyị tozuruoke nọrọ n'ụte ọrịa, ụmụ ya ga-aga mee ka ndị mụrụ ya mara na ahụ esighi ya ike.

Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ nwụọ, ụmụ ya ga-alaghachị ga gwa ha na ọrịa ahụ na-arịasi nne ha ike.

Ezinaụlọ mụrụ nwaanyị ahụ ga-abịa hụ ozu ya tupu etinye ya n'ime njụ oyi.

Ọ bụrụ na oge e ji eli ya ruo, ụmụ ya ga-aga kwa gwa ndị ikwunne ha na ha chọrọ ili nwaanyị ahụ.

Ndị ikwu nwaanyị ahụ ga-agụpụta ihe ndị ha chọrọ ka ụmụ ya mere ha nke gụnyere anụ ehi a manyere akwa 'George', ọjị, mmanya dgz. (Ịkwa ngwa ozu).

N'oge olili nwaanyị ahụ, anụ ọbụla ụmụ ya gburu e ji eli ya, ha ga-enye ndị ikwunne ha akụkụ anụ ahụ ruru ala.

Ihe gbapụtara ihe n'usoro niile a

Usoro ndị Igbo ji eli nwaanyị bụ na

  • Ndị lụrụ ya ga-ebu ụzọ mee ka ndị mụrụ ya mara na ọ nwụọla.
  • Mgbe ụfọdụ akụkọ ọnwụ nwaanyị tozuruoke na-abụ ihe ọṅụ nye ezinaụlọ ya dịka a ga-enwe oriri na nkwari dị iche iche n'emume olili ya.
  • Ụdị emume a na-eme gụnyere igbu ehi, ewu, ọkụkọ, mmanya, nri nakwa ihe ndị ọzọ na abụ etu aka si hara ezinaụlọ nwaanyị ahụ.