'Nwa e bu n'afọ na-agba ọkada na Nnewi' - Nwaanyị ji ọgbatumtum achụ ego
Dịka Mary Jane si ekwu ya, nwaanyị ịgba ọgbatumtum abụghị ihe ntabi anya ebe ya si bu Nnewi.
Ọ sị na ya bịara Lagos hụ na ọ bụ nanị ụmụ nwoke na-agba ọgbatumtum.
Nke a were dịrị iche n'ihe ọma na Nnewi bụ ebe ọgbatumtum bụ ihe ejiri mara ụmụnwaanyị.
Nke a mere na o kpebiri na ya ga-esonye na ndị ji ya bụ atụmatu akpọrọ 'ịgba ọkada' achụ ego.
Lee ihe nkiri a mata njem Mary Jane.