You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Crime fighting: Nwaagboghọ a sị na ọ bụ 'oji egbe ezu' abanyela n'akpa ndị uweojii
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtu a
Maka nwaagbọghọ oji egbe ezu
Aka ndị uweojii akparala nwaagbọghọ onye a na-eche na ọ bụ onye oji egbe ezu n'Eziowelle, Idemili North n'Anambra Steeti.
Onye gbara ama a bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed bụ onye sị na o teela ya bụ nwaagbọghọ mewere ndị ogbe ha ụra adị n'anya.
Maka ndị omekome na Kastina steeti
Akụkọ na-eru anyị ntị na Kastina steeti na-ekwu na ndị omekome awakpola ma zuo ihe ndị mmadụ na Danbirgima dị na okpuruọchịchị Kankara.
Gambo Isah bụ ọnụ na-ekwuru ndị ụweojii na steeti ahụ sị onweghị onye egburu na ya bụ mwakpọ ruchara awa abụọ.
Egbe ọnụ Briten na Iran
N'ofesi e, Jeremy Hunt bụ odeakwụkwọ ukwu mba Briten ekwuola na ha anaghị eche echiche ọgụ n'ikpezi okwu ụgbọmmiri ha abụọ a na-ebo mba Iran ịkpachi.
Hunt sị mana ọ bụrụ na Iran ahapụghị ụgbọmmiri ahụ ngwangwa na ha ga-ata aka n'eze mgbe adịghị anya.
Uwa agba Romelu Lukaku gharị
N'egwuruegwu, nke na-akpọtụ ugbua bụ na Manchester United ajụla nde Naịra iri isii Inter Milan ji chọọ ịzụrụ Romelu Lukaku.
Ha sị na o rughị ọnụego egoro ya.
Gee akụkọ BBC Igbo ebe a
Ohere enyere Atiku ịkpọ akaebe agafeela
Ndị zọrọ ọkwa dịka onyeisiala Naịjirịa na osote ya n'okpuru pati Peoples Democratic Party (PDP) bụ Atiku Abubakar na Peter Obi, ewetachaala ihe ndị ụlọikpe chọrọ n'aka ha dịka ha na-agba Onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ maka ntụlịaka e mere n'afọ 2019 a.
Ha kpọtara ndị akaebe 62 n'ime 400 ha kwuburu na ha ga-akpọta.
Ka ọ kwụ ugbua, ọ bụzị ndị Independent National Electoral Commission (Inec), All Progressives Congress (APC) na Buhari ga-akpọta ndị akaebe nke ha ga-eji zara ọnụ ha n'ụlọikpe.
Otu n'ime ndị PDP kpọrọ bụ Osita Chidoka, bụ onye bụbụ Minista na-ahụ maka njem nakwa onyeisi ndị ọrụ nchekwa njem.
Chidoka kwuru ihe ọ ma dịka onye so rụọ ọrụ banyere ntụliaka n'ogige PDP.
Mba Briten adọọla Iran aka na ntị maka ụgbọmmiri ha
Ndị mba Briten na-eche oke echiche banyere etu ndị mba Ịran si kpachie otu ụgbọmmiri ha a kpọrọ Stena Impero maka "ịda iwu ndị mba nke metụtara njem osimiri".
Onye na-ahụ maka mmekọrịta mba Briten na mba ndị ọzọ bụ Jeremy Hunt, dọrọ aka ntị hoo haa na ihe na-adịghị mma ga-eme ma ọ bụrụ na ha emezighi ihe ha mebiri ọsịsọ.
N'egwuregwu,
Ndị mba Senegal bu aka n'isi na-eti okokoko ka ndị Ọljiria gbawara ha aka Iko Mba Afrịka nke afọ a.
Ọljiria ji naanị otu ọkpụ goolu e nyere n'ime nkeji abụọ e ji malite egwu ikpeazụ wee bute iko aka ha emetụbeghi n'afọ iri abụọ na itoolu.
Gụọ maka mmeri ha n'uju ebe a: Senegal alụchaala ọgụ Algeria enwere akụkọ
Gee nkeji BBC ebe a:
Ihe nkiri a ga-amasị gị: