Keke operators: Ndị na-anya keke n'Umuahia na-eti mkpu maka oke nnapụ ego

Gọọmenti Abia steeti ekwuola na ha na-elebanya n'ihe kpatara ngagharịwe ndị na-anya ọgbatum tum a kpọrọ keke mere ụbọchị Monde.
Ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ Abia steeti bụ Onyebuchi Emenanka gwara BBC Igbo na ndị ọkwọụgbọala a buru nsogbu a ga-ekpesa n'aka onye nnọchiteanya okpuruọchịchị Umuahia-Sentalụ.
Emenanka kwuru na ya bụ ozi ga-esi n'aka onye ụlọomeiwu ahụ bụ Chinedum Orji ga-eruriri gọvanọ Okezie Ikpeazu ntị.
Mgbe anyị jụrụ ya maka mgbe ha ga-egbo mkpa ahụ, Emenanka kwuru na ọ gaghị ete aka.
Otu nwaagbọghọ tụrụ arịrị ahụhụ ọ tara ụbọchị Mọnde maka ụkọ ndị na-anya ọgbatumtum 'Keke'.
O depụtara n'akara Twitter sị:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị ọkwọ 'keke' kwuru na ndị agboro na-apụ ha ọtụtụ ego n'ike.









