Ecowas Single Currency: Ihe i kwesiri ịma maka atụmatụ a

Ebe foto si, Ecowas Facebook
N'ụbọchị 29 nke ọnwa Juun 2019, otu jikọtara mba ọdịda anyanwụ Afrịka bụ Ecowas kwekọrịtara na aha a ga-akpọ ego mmekọrịta mba dị na mpaghara ahụ.
Ecowas - bụ otu nwere mba 15 n'ime ya - sị na aha ego ahụ ga-abụ "Eco".
Nkwekọrịta bịara ka afọ 30 gachara kemgbe amalitere okwu inwe otu ego na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka tinyere ọkụ n'ite atụmatụ a ndị Ecowas na-esi.
Mana, ihe ọtụtụ mmadụ amaghị bụ ihe nwepụta ego ọhụru a ga-apụta n'ahịa nakwa na mmekọrịta obodo mba dị iche iche n'ọdịda anyanwụ Afrịka?
Ọ bụ n'afọ 2020 ka Ecowas sị na a ga-amalite rewe ego 'Eco' a, mana ọ dịghị ka ndị mmadụ ama maka nke a.
Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ya anụbeghị maka ihe a kpọrọ "Single currency".
Nke a pụtara na ọrụ karịrị nke ndị Ecowas ga-arụ maka atụmatụ a.
Mana ọbụghị naanị ime ka ndị mmadụ mata maka ego a dịrị ndị Ecowas.

Ebe foto si, Ecowas/Facebook
Ọ bụ n'afọ 1975 ka Ecowas malitere. N'ime mba 15 sonyere n'Ecowas, asatọ - Benin, Burkina Faso, Guniea-Bissau, Ivory Coast, Mali, Niger, Senegal na Togo - na-erikọta ego akpọrọ CFA franc.
Atụmatụ 'Eco' a ga-eme ka mba ndị a kwụsị iri CFA franc.
Ọfọdụ ndị na-akwado atụmatụ a na-ere etu mba ndị a ji na-erikọ CFA france ka etu Eco ga-esi gaa.
Agbanyeghị nke a, onyeisi ndị na-enyocha ihe banyere akụnaụba ọha n'ụlọọrụ PwC West Africa bụ Andrew S. Nevin gwara ụlọ ntaakụkọ France 24 na "Atụmatụ inwekọ ego a erughi erụ, ọkachasị etinye uche na Naịjirịa ebinyegbeghi aka n'atụmatụ nchịkọta ọdịda nnywanwu Afrịka."
Maazị Nevin gakwara n'ihu sị na inwe otu ego abụghị oke mkpa ugbua.
"Ị ga-ebu ụzọ hazie etu esi eme nkwekọrịta ndị ọzọ e nwere banyere azụmaahịa na mpaghara ahụ, ga zie hazie ihe mmepe obodo."
Farida Adamu bụkwa onye ọkammụta n'ihe banyere akụnaụba kwenyere na Afrịka adịbeghi njikere maka ego nwekọrịta.
Adamu sị: "Ya bụrụ na a ga-eme ya, e kwesiri ịhazị etu e si ere ego bụ nke Bekee kpọrọ "Monetary Policy", ọkachasị etu o si metụta mpaghara ndị emepebeghi nke ọma."









