Mohamed Morsi: aka chịbụrụ Egypt anwụọla ka ọ dara n'ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na sị na Mohammed Morsi bụbụ aka na'achị mba Ijipt nara mụọ n'ụlọikpe na Kaịro bụ isi obodo mba ahụ ka ọ gara ụlọikpe dịka ndị ọrụ nchekwa n'ikpe siri kwuo.
otu onye na-arụ ọrọ n'ụlọ ikpe sị: "Ọ na-agwa ọkaikpe okwu tupu ọ daa. E buru ya gawa ụlọ ọgwụ bụ ebe ọ nọ nwụọ,"
Morsi bụ onye mbụ ritere ọchịchị n'ọnọdụ onye kwuo uche ya.
Ọ nọrọ otu afọ n'ọkwa tupu ndị agha chutuo ya n'afọ 2013 ka ọgbaghara dara na mba ahụ.
Morsi nọ mkpọrọ kemgbe a mara ya ikpe maka ndị nwụrụ n'ọgbaghara eji wepụ ya n'ọkwa.
Gọọmentị Ijipt ji aka ike sowe ndị na-akwado Morsi nakwa ndị otu Alakọba akpọrọ "Muslim Brotherhood", bụ ndị o si n'okpuru ha nwete ọchịchị.
Ikpe a na-ekpe Morsi tupu ọ nwụọ bụ nke metụtara ebubo na aka ya dị n'ime ịgba ama a sị otu Hamas nkle Palestine mere n'Ijipt.
Onye bụ Morsi?
A mụrụ Morsi na obodo El-Adwah dị na Mpahra "Nile Delta" nke Sharqiya n'afọ 1951.
Ọ gụrụ Nka na Mahadụm Kaịro tupu ọ ga mba Amerịka ga gụọ ọkamụta.
Otu Muslim Britherhood hopụtara ya ka ọzọ ọchịchi dịka onyeisiala n'afọ 2012 ka a manyere onye ha chọrọ ka ọ pụọ.
Ka o meriri, o kwere nkwa na ya ga achị ndi Ijipt niile.
Ọtụtụ ndị akwadoghi ya sị na-omezughi nkwa ya n'ime otu afọ a ọ chịrị Ijipt.
Ndi mmadu banyere ọzọ ịsị ya rituo n'ụbọchị o mere otu afọ n'ọchịchị n'ụbọchị Juun 30 nke 2013.
Na mgbede Julaị 3, ndi agha wezugara iwu ji mba Ijipt ma kwuo na ha enwela gọọmentị ọzọ.
Morsi si na ekweghi na nke a.
Ndị agha nwụchịrị ya were tuba ya na mkpọrọ.








