Gwongworo abụọ bu mmanụ ụgbọala enwurula ọkụ ma gbapịa ụgbọala n'ụzọ Legọs
Akụkọ na-ewu na mgbede a

Ebe foto si, Trace
Ihe mberede okporoụzọ emerụọla mmadụ ise ahụ n'ụzọ si Ibadan gawa Legọs
Ihe ruru mmadụ ise merụrụ ahu n'ụtụtụ taa ka gwongworo abụọ bu mmanụ ụgbọala kwakọrọ isi n'ụzọ si Legọs gawa Ibadan.
Ndi hụrụ mgbe o mere si na ọkụ si ihe mberede a gbara ụfọdụ ụgbọala ndi ọzọ nọ n'okporo ahụ.

Ebe foto si, Bashir Ahmad/ Twitter
Onyeisiala Buhari na ndi ọzọ anụọla iyi ọrụ
Njem ọchịchị onye kwuo uche ya nke ọzọ malitere taata na Naịjirịa dịka onyeisiala Muhammadu Buhari, osote ya na aka na-achịgasị steeti dị iche iche ọnụrụ iyi ọrụ.
Nke bụ agba nke atọ Buharị dịka onyeisiala Naịjirịa dịka ọchịbụrụ ka onye agha n'afọ 1984 tupu ọ rịa dịka onye nkiti n'afọ 2015.

Gọvano ndị ọwụwa anyanwụ ano sọkwa na ndị ṅụrụ iyi ọrụ taata.
Steeti ndị a bụ Ebonyi, Enugwu, Imo na Abịa.

Ebe foto si, family handout
Anwụchiela mmadụ 16 maka iji ọkụ gbagbuo nwa agbọghọ
Na mba Bangladesh, a kpupula mmadụ iri na isii a na-eche n'aka ha di n'ihe mere nwa agbọghọ eji ọkụ kwagbuo ụlọikpe.
Awụrụ Nusrat Jahan Rafi mmanụ ọkụ wee munye ya ọkụ ka ọ gbara ama na onye isis ọlụ akwụkwọ ha na awakpo ha n'ike.

Ebe foto si, Getty Images
'Ipob nyụọ anwu, ọ gbaa ha!' - Onyeisi ndị uweojii n'Enugwu
Ndi uwe oji n'Enugu steeti esitela n'ọnụ 'commissioner of police' bụ Suleiman Balarabe gwa ndị Enugu steeti na ha dị njikere maka iwu ndị Ipob mara gwa ndị mmadụ na ha aputa kwala ezi n'ụbọchi Mei 30. Ha kwuru nkea na ọgbakọ ha na ndị otu na ngalaba dị iche iche n'Enugu steeti nwere.

Ebe foto si, Reuters
Germany na France: Onye ga achị EU ?
Germany na France na-ama aka ọnye ga-achị European Union dịka emechara ntuliaka ịhọpụta onyeisi otu ahụ n'ụbọchị May iri abụọ na asatọ.
Nne ukwu ndị Germany bụ Angela Merkel chọrọ ka ọnye nke ya banye mana ọnyeisiala France bụ Emmanuel Macron akpọtaghị nwoke Germany aha dịka ọnye na-azọ oche onyeisi EU.

Ebe foto si, Reuters
'Mmachi USA machiri anyị ga eri ọrụ igwe mmadụ n'Amerịka' - Huawei
Na mba US, ụlọọrụ Huawei na-empụta ekwentị ekwuola na mmachi a machiri ha ga-emetụta ndị mba US n'ụzọ na-adịghị mma.

Ebe foto si, Getty Images
N'Egwuregwu,
Chelsea na Arsenal bụ otu egwuregwu na-ejighị anya ahu onwe ha ga-akwata ya n'agba ikpeazu asọmpị English Europa League taa n'ọgbọ egwuregwu Olympic dị na Baku, Azerbaijan.










