Governorship election: Anyị akwụchaala ndị ọrụ ụgwọ ha - Ikpeazu
Gọvanọ Okezie Ikpeazụ kwuru na ntuliakia gọvanọ e mere n'Abia Steeti bụ nke kachasị nwee udo na Naịjirịa gbaa gburugburu.
Na Mkaprịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Okezie kwuru na ndị na-asị na o mere nrụrụaka na ntuliaka bụ ndị na-amaghị ihe ha na-eme.
O kwuru na ebe ndị a na-akpọ aha bụ ebe ndị o nwere mmeri kama ha akpọghị ebe ndị ha meriri dịka ebe e mere nrụrụaka.
Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmentị ya ejighi ndị ọrụ ụgwọ kama na ọ bụ ụfọdụ ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Sekọndịrị mana na ọ ga-akwụchapụ ha ụgwọ.
Okezie kwukwara na ụgwọ ndị lara ezumike nka bụ ibu o butere n'aka ndị chịburu Abia Steeti na mbụ kama na o ji nwayọ na-akwụcha ụgwọ ndị a.
