You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kabba: Atiku ezigarala Osinbajo ozi itiakanobi gbasara ụgbọelu ya
Osote onyeisiala Yemi Osinbajo ekeelela ndị mmadụ dịka ụgbọelụ bu ya dara n'ike na Kabba taa.
O sị na ha dị mma nakwa ekwu na ya na ndị otu ya kwnyere na chineke ị chekwa ha n'oge a.
Atiku Abubakra bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru otu PDP ezigarala Osinbajo ozi itiakanobi site n'akara Twitter ya.
Cheta na Laolu Akande bụ onye na-ekwuchitere Osinbajo zipụrụ ozi a site n'akara Twitter ya.
Ọkammụta Osinbajo na ndị ọzọ so na ya bụ ụgbọelụ helikọpta emerụghgị ahụ dịka o nwekwaghị onye nwụrụ n'ihe mberede ahụ.
Osinbajo na-aga achụmnta vootu na Kabba Kogi steeti mgbe ihe a mere.
Nke a bu ugboro abụọ udirị ihe na-eme Osote Onyeisiala Osinbajo.
N'afọ 2018 Osinbajo gbalahụrụ ọdachị mgbe ụgbọelu bu ya ga-ụlọakwụkọ akpọrọ Nigerian Customs Command and Staff College nke dị na Gwagwalada nwere nsogbu n'elu.
Mana, nke mere ugbua, site na foto di na soshal midia, mere ka ọkarịrị nke afo gara aga.
Agbanyeghi ihe mere, Osinbajo akabighi njem achụmta vootu ọ nọ na ya.
Dịka otu onye ọrụ Onyeisiala Buhari siri kwuo.