You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Agwọ atụọla nwanyi n'ike n'ulo mposi
Otu nwaanyị bu aka n'otele ka agwọ tụrụ ya ebe ọ chọrọ ịga mposi n'ụlọ, n'Ọstrelia.
Dịka onye wepụtara agwọ ahụ si kwuo, Helen Richards dị afọ 59, chọrọ ịga mposi n'ụlọ otu onye ezinaụlọ ya ọ gara ileta, oge agwọ ahụ selitere isi wee tụọ ya ka ọ bụ onye o ji ụgwọ.
N'ihi na agwọ ahụ enweghi elo n'ime ahụ ya, ihe a gwọrọ Richards bụ naanị ebe eze agwọ ahụ tụpuru.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ sị "otu ihe metụtara m ka m tukwuru ala, m malie elu ka mmọnwụ a na-akwa aka, peteri m wụsa n'ala, m wee hụ ihe yiri mbe olu ya toro ogologo ka ọ na-amaghachị n'ime mmiri."
Jazmine Zeleny bụ onye nwụchiri agwọ ahụ kwuru sị na ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ agwọ n'ime mposi ọkachasị oge ihuigwe dị ọkụ, makana agwọ ga na-achọ ebe mmiri dị.
O kwukwara na ọ bụ ụjọ mere agwọ ahụ ji makwasị Richards, makana ọ nọchiri ebe o kwesịrị isi pụọ.
Agwọ ndị a akpọrọ "carpet snake" anaghị enwe elo, mana ndị ọkachamara na-akọwa na ọ na-aka mma ịgba ọgwụ tetanụs iji gwọọ onye ọ tụrụ.
O nweela oge oke ọkụ ihuigwe gburu ọtụtụ ịnyịnya, ụsụ nakwa azụ.
Akụkọ ga-amasị gị: