Body Building: Anyị ejighi akpụ ọbi eyi ndị mmadụ egwu - ndị na-akpụ ụzụ n'Awada
N'Awada, ndị Wemblys Super Stars Club bụ ndị ama ama makana ha niile gbachara dịmkpa ọfụma site n'ịkpụ ụzụ bụ ihe ha na-eme.
BBC Igbo gara ọdọ egwuregwu ha n'Awada were chọpụta na ndi a abụghị ndị enweghị ọrụ maka ọtụtụ n'ime ha na-arụgasị ọrụ dị iche iche.
Ndị Wemblys bụkwa ndị eji ịdịnotu mara, dika ha na-enyere onwe ha aka.
Ha gwara BBC na ọtụtụ n'ime ha esiela na-ịkpụ ụzụ gaa mba ofesi.
Ihe ọzụ tụrụ BBC n'anya bụ na ọ bụ ndị Wemblys na emepụta akụrụngwa ha ji akpụ ụzụ.
Gee ha ntị n'elu.