You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Trump: Aga m akwụsị ndị mba ọzọ amụrụ n'Amerịka ị bụ ndị mba anyị
Akụkọ dị mkpa
Nwa mba ọzọ amụrụ na Amerịka agaghị abụzị nwafọ Amerịka - Trump
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump aṅụọla iyi na ọ ga-akwụsị ikike iwu kwuru na nwa ndị mba ọzọ a mụrụ na Amerịka ga-abụ nwafọ mba Amerịka.
Ọ gbarụrụ ihu na ọ bụ naanị Amerịka ka ụdị iwu a dị ire, ma kwuo na ọ ga-agbanwe iwu a ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị tinyere aka n'akwụkwọ.
Trump kwuru na nke dị mkpa maka ibelata ọnụọgụgụ ndị mmadụ na-abata n'Amerịka kwa mgbe.
Buhari aṅụọla iyi maka ọgbaghara Kaduna
Onyeisiala Muhammadu Buhari aṅụọla iyi na ọ ga-ememina ndị aka ha dị n'ogbugbu ndị mmadụ na Kaduna Steeti.
N'aka nke ọzọ ndị uweojii na ndị otu Shiite na-achịpụ ya na mpaghara Wuse dị n'Abuja dịka ọtụtụ ụgbọala gbarala ọkụ.
Nye anyị nghazigharị obodo were onyeisiala - OYC
Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo nke onyeisi ha bụ Kingsley Dozie tinyere ọnụ na ka enye ha nhazigharị obodo karịa onyeisiala n'afọ 2023.
Ha gbarụrụ ihu n'okwu minista na-ahụ maka ọkụ latrik bụ Babatunde Fashola kwuru na ọ bụ ndị ndịda anyanwụ nwe ọkwa onyeisiala n'afọ ahụ.
N'ofesi
Otu onye nọọsụ na mba Jamini akpọrọ Niels Hogel ekwupụtala na o ji ọgwụ gbagbu otu narị mmadụ dịka a na-ekpe ya ikpe.
O kwuru na ọ bụ ka owere ya gosi ndị nọọsụ ibe ya na ọ ga-etuteli ndị ọ gbara ọgwụ ahụ.
N'egwuregwu
Onye na-agbara Tottenham bọolụ bụ Dele Alli etinyela aka n'akwụkwọ ga-agbatị ọnụnọ ya na Tottenham rue afọ 2024.
Nwa amadịa batara n'afọ 2015 enyeela gọọlụ iri anọ na asatọ n'asọmpi otu narị na iri ise na atọ.
Nkeji abalịa:
Ihe nkiri:
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ
Gọvanọ ndị na-achị steeti iri atọ na isii dị na Naịjirịa na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ga-enwe nzukọ taa ebe ha ga-etikọta isi ọnụ kpebie maka ụgwọ opekatampe.
Mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba obodo bụ Zainab Ahmed nakwa nke na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige, ga-esonye na ya bụ nzukọ.
Na mba ofesi,
Onyeisiala mba Jamini bụ Angela Merkel, ekwuola na ọ gaghị azọ ọkwa ọchịchị ọzọ ma oge ya gwụ n'afọ 2021.
O kwukwara na ọ gaghị azọ ọkwa 'onyeisi' otu pati ya bụ CDU ọ bụ onyeisioche ha kemgbe afọ 2000, mgbe ntuliaka ya ga-abịa n'ọnwa Disemba.
N'akụkọ ọzọ,
A ka na-achọ ndị mmadụ ruru otu narị na iri asatọ na itoolu nọ n'ụgbọelu Lion Air ahụ dabara n'ime okeosimiri n'obodo Jakarta dị n'Indoneshia.
Ka ọ dị ugbua, ezipula teknụzụ a na-akpọ sonar nakwa drone iji nyere aka chọta ma e nwere ndị dị ndụ, ebe ọ bụ naanị ngwongwo ndị mmadụ na akụrụngwa si n'ụgbọelu ahụ ka a ka na-agụpụta na mmiri ruo ugbua.
N'egwuregwu,
Otu Real Madrid achụọla Julen Lopetegui ụkwụ eru ala na-erughi ọnwa ise o bidoro ọrụ.
N'otu aka ahụ, Manchester City ji otu ọkpụ goolu merie Tottenham ka ha zutere n'asọmpi Premier League n'abalị ụnyaahụ.
Gee akụkọ niile a n'otu nkeji ebe a:
Lee ihe nkiri nke taa:
Ralph Uwazurike bụ onye ndu ndị MASSOB kwuru ihe o che maka Biafra nakwa ihe mere o ji kwuo na ọ bụzị ihe e ji egwu egwu.