2019 Election: Ọgụ na mgba chere Abịa steeti n'ihu
Ndọrọndọrọ onye ga-abụ gọvanọ n'Abịa steeti n'afọ 2019, agaghị abụ ụkwa achị n'aka agba egwụ.
Nke a bụ n'ihi ndọrọndọrọ na-ebiri ọkụ dịka ndị ga-asọkọ mpị maka ọkwa gọvanọ na steeti ahụ na ndị kwụ ha na azụ.
Onye ọnụ na-eru n'okwu banyere ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ọkaiwu Chima Nnaji kọwara n'ọ ga-akpụ ọkụ n'ọnụ n' Abia Steeti n'afọ 2019.
Nkọwa ya gbakwasịrị ụkwụ na nhọpụta pati APC họpụtara Uche Ogah dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ nakwa pati PDP sịrị gọvanọ Okezie Ikpeazụ chịzuo afọ anọ ọzọ.
BBC Igbo jụrụ Nnaji etu ọnọdụ ndọrọndọrọ n'Abia steeti nwere ike ịdị n'afọ 2019.
O kwuru na "ahịa ọma na-ere onwe ya".
Na ọ bụrụ na Gọvanọ Ekezie Ikpeazụ chịzie ndị Abia nke ọma na o nweghị ihe ga-eme ka ha ghara ịhọpụta ya ọzọ.
O kwukwara na ndị Abia anụla ụtọ maọbụ ụfụ ọchịchị dị iche iche kama na ọ bụ ha ka ọ dị n'aka inwe mgbanwe.
Nnaji rụtụrụ aka na mpụ na aghụghọ dị ntuliaka bụ ihe ọzọ nwerei ke ime ka ebumnobi ndị Abịa ghara imezu n'afọ 2019.
N'ikpeazụ Nnaji dọrọ ndị Abia Steeti aka na ntị ka ha kee nkwụcha chekwa vootu ha n'afọ 2019.
