EFCC agọọla na ọbụghị ha zigara ndị ọrụ ha wakporo ụlọakụ Standard Chartered

Dika ụlọakụkọ Reuters siri kwuo,ụlọakụ Standard Chartered dị na Legọs ụbọchị Friade.

Akụkọ kwuru na ndị ọrụ EFCC gara ije ahụ gbalịrị ịnwụchi onyeisi ọrụ ụlọakụ ahụ a kpọghị aha ya.

Mana mbọ ha mara afọ n'ala n'ihi na onye ha chọtara kpochiri onwe ya n'ime ụlọọrụ.

O doghị anya ihe mere ha jiri wakpo ụlọakụ ahụ, mana cheta na Standard Chartered so n'ụlọakụ anọ, ụlọakụ etiti bụ CBN riri iwu maka inyere ụlọọrụ ekwentị MTN ibupụ ego ruru ijeri dọla 8.134 n'ụzọ megidere iwu.

Ụlọakụ Standard Chartered kwuru na o nweghị ihe ha mere bụ nke kwesiri ịkpọta ndị ọrụ EFCC n'ụlọọrụ ha.

Ha kwukwara na ndị ọrụ EFCC bịara ma lakwa na-egbughi oge ọbụla.

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwujaren kwuru na ozi o wepụtara na EFCC awakpoghi ụlọakụ ahụ kama ọ bụ aka ọrụ ndị ọrụ nnupuisi ha ndị na-aga ozi ezighi ha.

O kwuru na EFCC ga-enyocha ndị gara mwakpo ahụ.

"A na-akpọ ndị isi ọrụ ndị ụlọọrụ a oku ma ọ bụrụ na EFCC chọọ inyocha ha.

"N'oge gara aga, ndị ụlọakụ na-akwado ọfụma inyocha ndị ọrụ ha."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: