Ihe mere na ntuliaka okpuru ọchịchị nke Imo steeti

Ihe onye ntaakụkọ BBC Igbo jiri anya ya hụ gosiri na ọtụtụ ndị mmadụ esonyeghị na ntuliaka okpuru ọchịchị e mere n'Imo steeti na Satọde.

Na agbanyeghị nke a, ngalaba ntuliaka ahụ mekwara kpọ ndị meriri, nke pati na-achị steet ahụ bụ APC nwetera mmeri n' ọchịchị ime obodo 27 dị na steeti ahụ.