Third mainland: Anyị ga-ata ahụhụ

Aha onyonyo, Third mainland: Anyị ga-ata ahụhụ

Ụfọdụ ụmụ Igbo bi na Legọs akọwaala ụdị ahụhụ ha ga-ata ma ọ bụrụ na emechie akwammiri 'Third mainland' dịka gọọmentị si kwụọ.

Gọọmentị Legọs steeti kwuru na a ga-emechi akwammiri 'Third mainland' site n'abalị iri abụọ na atọ ue iri abụọ na isii nke ọnwa Ọgọstụ nke afọ a.

Ha kwuru na nke a bụ iji mee nyocha n'akwammiri a tupu ha na-arụ ya ọrụ na ngwụcha afọ ma ọ bụ mmalite afọ 2019.

N'ajụjụ ha zara BBC Igbo, ọtụtụ ndị Igbo bi na Legọs etiela oke mkpu na nsogbu chere ha n'ihu ma ọ bụrụ na emechie ya bụ akwammiri 'Third mainland'.

Maap Obodo legọs

Ọ bụrụ na i bi na Legọs, tụlee maap a ka ị mara ụzọ ndị ọzọ ga-esi ma ọ bụrụ na e mechie akwammiri 'Third mainland' ka ọ dịrị gị mfe.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: