Mgbasa akụkọ asị na-ekewa obodo - Lai Mohammed

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Lai Mohammed

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe Lai Mohammed kwuru banyere ebubo nwunye Nnamdi Kanu boro gọọmenti etiti

Gọọmentị etiti na-ebuzi atụmatụ mgbasa ozi megide akụkọ asị na-aga n'ụlọ mgbasa ozi dị iche iche na Naịjirịa.

Nke a bụ dịka Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohammed kwuru na akụkọ asị bụ ihe iyi egwu megide udo na ị dị n'otu Naịjirịa.

Moses Ekpo

Ebe foto si, Akwaibom state govt website

Osote gọvanọ Akwa Ibom steeti bụ Moses Ekpo agụpụla aka ya n'akụkọ na-ekwu na ọgbaala arụkwaghịm n'ọrụ ya.

Site n'aka ode akwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Ekikere Umoh, o kwuru na nke a bụ ezigbo okwu asị.

Ọgbaghara mere na Zimbabwe

Ebe foto si, Getty Images

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọtụtụ ndị mere ngagharị iwe na mba Zimbabwe a na-eche na ha bụ ndị pati MDC Alliance awụchiela n'ụlọikpe n'ihi ebubo ime ọgbaghara na ntuliaka.

Cheta na mmadụ isii nwụrụ na ngagharị iwe a ha mere mgbe ha na ndị ọrụ nchekwa bukọtara isi.

N'egwuregwu,

Emmanuel Amunike

Ebe foto si, Getty Images

Mba Tanzania emeela Nwafọ Naịjirịa gbara bọọlụ n'oge gara aga bụ Emmanuel Amunike onye nkuzi otu egwuregwu bọọlụ ha.

N'asọmpi Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị nọ n'okpuru afọ iri abụọ, Mba Jamịnị ji otu ọkpụ merie ndị Falconets nke Naịjirịa.

Falconets nke Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo, Ike Uche: Nrubeisi bụ ụzọ eji eme nke ọma na bọọlụ