Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Ụlọomeiwu mba Saụt-Sudan enwetala ego mgbazinye ruru nde dọla 16 iji zụọ ụgbọala
Ndị ọchị ehi akpala ike karịa Boko Haram

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-elebe anya n'ọgbaghara na mba ụwa bụ International Crisis Group ekwuola na ịkpa ike ndị na-achị ehi na Naịjirịa ji ugboro isii karịa nke ndị Boko Haram.
Nke a dị n'akwụkwọ ha wepụtara n'ọkara afọ a ma gwaa gọọmenti Naịjirịa ka ha kee ajị n'ume iji belata nwakpo ndị a.
Fr. Mbaka akatọọla ọchịchị Buhari

Ebe foto si, Adoration Ministry/ Getty Images
Ụkọchukwu a ma ama bụ Rev Fr. Ejike Mbaka ezigarala onyeisiala Muhammadu Buhari ozi na iwe Chineke adịla ọkụ n'ebe ọ nọ maka ọchịchị ya'.
N'okwu ya Mbaka siri na ọchịchị Buhari bụ 'Demon-cracy na ọ bụghị Democracy'.
Na Mba Afrịka

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ụlọomeiwu mba Saụt-Sudan enwetala ego mgbazinye ruru nde dọla iri na isii n'aka gọọmentị ha, iji zụọrọ onwe ha ụgbọala.
Agbanyeghị na ndị mba ahụ gbarụrụ ihu n'ihi nke a, ọnụ na-ekwuru onyeisiala kwadoro nke a ma kwuo na ndị ụlọomeiwu agaghị anya ụgbọ ọgbatumtum.
N'egwuregwu:

Ebe foto si, Getty Images
Athletico Madrid ewerela ọkpụ goolu atọ asatara otu na penariti merie ndị Arsenal n'asọmpi International Champions Cup.
Athletico meriri na-agbanyeghi na ndị ọgba bọọlụ ha dịka Antoine Griezmann na Diego Costa esoghi n'asọmpi ahụ.
Gee nkeji anyị nke abalị a
Lee ihe nkiri anyị











