You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anya hụrụ Nmachukwu kọrọ ndị uweojii
Otu nwa nwaanyị a kpọrọ Nmachukwu Ebiowu dị afọ atọ efuola n'obodo Okoti n'Anambara steeti.
Dịka ndị uweojii si kwuo, Nmachukwu na nne ya bụ Juliana Ebiowu gara mmemme mmechi ụlọakwụkwọ ya na 'The Light International School'.
Mgbe obere oge gachara, nne ya amalite ị chọ ya rue ugbua, ma ahụbeghị ya.
Ezinaụlọ ya na-arịọ ndị ọha niile enyemaka ị chọta Nmachukwu e kwuru dị ọcha ma na-asụkwa asụsụ Igbo ọfụma.
Ndị uweojii kwuputara na akụkọ yiri nke a mere n'ụlọakwụkwọ pramarị ọzọ n'Amawbịa ebe ụmụnwanne abụọ bụ Chidera na Kamsiyochukwu Iloka si n'ụlọakwụkwọ ha fuo.
Ha ji ohere a adọ ndị nnenanna nakwa ndịisiụlọakwụkwọ dị icheiche ha saa anya ma dịkwa njikere na ihe gbasara nchekwa ụmụaka ha na-eleta anya.
N'akụkọ yiri ibe ya, ezịnaụlọ Ekene ka na-achọ nwa ha nwaanyị bụ Adaobi furu efu kemgbe ụbọchị Mee 1 na Legọs.
Ozi a na-ewu ewu n'elu soshal midia bụ ndị mmadụ na-achọ otu nwata nwaanyị akpọrọ Elo Ogidi ebe nne ya na nna ya malitere ị chọ ya mgbe ha gbasara ụka n'ụbọchị Julaị nke asatọ na Legọs.
Ndị uweojii na-arịọ na o nwee ndị mmadụ ma ihe gbasara ụmụaka a kpọọ ha na 08075690784 maọbụ 07039194222.