Ụka 'Assembly' etinyela ọnụ na nwụchi ụkọchukwu ha buru amụma megidere Rochas

Aha nkeananụānụ, Uweojii: Ndị ụkọchukwu ụfọdụ bụ ndị amụma ụgha

Ndị ụka Assemblies of God 'na-akwado ọsịsa ha na okwu gbasara onye otu ha ndị uweojii nwụchiri maka ibu amụma megide onye otu ha.

Ka BBC kpọrọ onyeisi ụka 'Assemblies' na mpaghara ọwụwa-anya nwụ Owerre, (Owerri-East District) bụ Rev Abel Amadị na ekwentị, ọ gwara anyị na ha na-akwado ọsịsa ha na ya bụ okwu nke ha ga-agbanakwụ nye ndị ntaakụkọ n'izụụka na-abịa.

Cheta na ọnụ na abalị ole na ole gara aga, ndị uweojii nwụchiri Chukwuma Okezuo bụ onye ụkọchukwu nọ n'ime ụlọụka 'Assemblies of God' buo amụma megide gọvanọ steeti ahụ bụ Rochas Okorocha.

Dịka ọnụ na-ekwuru ndị ụweojii n'Imo Steeti bụ Andrew Enwerem sirị kọwara, Okezuo kwuru na Rọchas na-eji obere ụmụaka agwọ ọgwụ iji chekwa onwe ya maka ntuliaka afọ 2019 na-abịa abịa.

Ọ gara n'ihu kwuo na nke a bụ imebi aha gọvanọ Rochas Okorocha na ibute ọgbaghara n'Imo Steeti.

Enwerem kwuru na a ga-akpọpụ nwoke a n'ụlọikpe ebe ọ ga-azara ọnụ ya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ