Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Aka akparala ndị gburu onyeeze n'Imo Steeti
Akụkọ dị mkpa
Aka akparala ndị gburu onyeze n'Imo Steeti.

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii n'Imo Steeti ekwuola na ha anwụchiela mmadụ abụọ bụ ndị a na-enyo enyo maka mgbabgu Eze Brendan Ibekwe bụ onyeisi ọchịchị obodo ndị Mgbe dị n'Orlu n'Imo Steeti.
Akụkọ kwuru na ndị a gbagburu onye eze a ma buru ozu ya gbafuo mana emechara hụ ebe ha tọgbọrọ ya.

Ebe foto si, Chuwang Dalyop
N'ime mmadụ iri asatọ na isii ndị uweojii kwuru na e gburu na Plateau Steeti otu nwoke aha ya bụ Ezekiel Danbwarang gwara BBC na ezinaụlọ ya mmadụ asatọ ndị gụnyere nne, nna, nwunye na ụmụ ya anọ so na ndị e gburu.

Ebe foto si, Getty Images
Taa ka Sịnetọ Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ gbaara Nnamdị Kanu Akaebe ga-awụchi n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.
N'ikpe ya n'oge gara aga, ọkaikpe Binta Nyako gwara ndị a ka ha kpọpụta Nnamdi Kanu n'ụlọikpe taa ma ọ bụ ha agaa akpọrọ.
Egwuregwu

Ebe foto si, AFP
Mba Spen na Pọtugal esorola na ndị bara n'agba nke abụọ asọmpi Iko Mbaụwa ebe mba Ịran na Moroko akwakọrọla ngwongwo ha laa.
Taa, ndị Naịjirịa na-enwe olileanya na Super Eagles ga-agafe dịka ha ga-ezute Ajentịna.
Nkeji nke ụtụtụ a:
Lee ihe nkiri anyị











