You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: NFF akwụbeghị ndị Super Eagles ụgwọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Ndị IPOB na-achọ inye ndị Ohaneze ọsọ n'ọgbakọ Ohaneze na-akwado ime.
Dịka a na-ele anya maka ọgbakọ ndị Ọhaneze chọrọ ime maka ịhazigharị obodo, ndị IPOB ekwuola na ha ga-me ọchụ ebe ahụ ma onye ndu ala Igbo ọbụla gaa ya bụ ọgbakọ.
Naịjirịa
Nyesom Wike na gọọmentị etiti na-akọrịta ọnụ nke ọhụrụ a.
Aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike etiela mkpu na gọọmenti etiti chọrọ igbu ya.
Mana ụlọọrụ onyeisiala kwuru na ebubo anụrụma codeine na-ebute na-efegharị ebe niile nke na-ekwesighi nzaghachi.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Gọọmenti etiti na-ekwu ka ụmụ Naịjirịa ghara iweghachite ndị PDP
Na aka nke ọzọ, ụlọorụ onyeisiala ekwuola na ụmụ Naịjirịa nwaa anwa weghachite ndị PDP n'ọchịchị, ị mara na ego niile PDP zuru a natara ha ga-alaghachikwurukwa ha ọzọ.
Akụkọ mba ofesi
A na-agba mbọ ijide ebola n'ime DR Congo sọọsọ.
Ndị na-chọ ịkwụsị ọrịa Ebola na Congo ebidola inye ọgwụ mgbochi a ka na-enyocha enyocha.
Ndị ọrụ ahụike ga-ebu ụzọ nara ya bụ ọgwụ.
N'egwuregwu,
NFF akwụbeghi ndị Super Eagles ụgwọ mana ha ga-akwụ na nso a.
Dịka asọmpi iko mbaụwa na-abịa, ndị NFF ekwuola na ha ga-akwụ ndị Super Eagles ụgwọ ha n'oge na-adịghị anya.
Super ga-agbakwa otu Athletico Madrid n'Uyo echi n'asọmpi enyi na enyi iji kwado maka asọmpi iko mbaụwa ahụ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa: