Ndị uweojii: Anyị akpachighị ndị Jew n'ụlọ Nnamdi Kanu

Dịka akụkọ na-ekwu na ndị uweojii nwụchiri ndị okpukperechi Jew n'ụlọ Nnamdị Kanu, Osote onyeisi ndị uweojii nke Zone 9 Umuahia bụ Karma Hassan ekwuola na onweghi ndị okpukperechi ọbụla ha nwụchiri.

Akụkọ kwụrụ na ndị uweojii kpachiri ndị okpukperechi Juu dị iri abụọ na otu n'ụlọ onye ndu ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu dị na Isiama Afaraukwu Umuahia, ụbọchị .

Odeeakwụkwọ mgbasaozi ndị Ipob bụ Emma Powerful gwara BBC na ndị jew ndị a na-anata ahụhụ ugbua na ngalaba ndị uweojii abụọ bụ CID na Zone 9 dị n'Umuahia.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Mgbe BBC Igbo gbara Powerful ajụjụ, o kwuru na ihe ndị uweojii mere ezighị ezi na onweghi ebe edere ya n'iwu ka ndị mmadụ ghara ikpere chi ha.

O kwuru na ọ bụghị ihe ọjọọ mmadụ ị ga n'ụlọ Nnamdi Kanu ma ọ bụ ịkpọku aha ya n'ebe ọbụla.

BBC Igbo gara n'ihu ịgba osote onyeisi ndị uweojii nke Zone 9 Umuahia bụ Karma H. Hassan ajụjụ, o kwuru na onweghi ndị okpukperechi Jew ụlọọrụ ya nwụchiri.

Hassan kwuru na onweghi etu esi anwụchi ndị mmadụ n'ụlọọrụ ya nke na ọ gaghị ama maka ya. O kwuru ka-akpọọ onye kọmishịọna ndị uweojii jụọ ya maka nke a.

Na nzaghachi Emma Powerful kwuru na okwu Hassan bụ asị na onye Kọmishọna ndị uweojii nọ n'okpuru ya kwesiri ịgwa ya ihe ọbụla mere n'ụlọọrụ ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ nkata ndị uweojii na gọọmentị iji megide ndị Ipob nakwa ndị Igbo.

BBC Igbo kpọrọ Kọmishọna ndị uweojii Abia Steeti n'ekwentị mana ọ zaghị ekwentị ya.