You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụmụaka isii adabala n'ime olulu nsi na Kenya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Akụkọ si Kenya eru anyị ntị na-akọwa na ụmụakwụkwọ isii dabara n'ime ụlọ mposi n'ụtụtụ Wenesde.
Ndị ụlọ ntaakụkọ Citizen TV kwuru na ihe a mere na mpaghara Nakuru county , nke ndị n'ugwu isi obodo Kenya bụ Nairobi.
Ụlọ ntaakụkọ Standard dele na onyeisi nkuzi n'ụlo akwụkwọ Kisulisuli kwuru na ụmụakwụkwọ anọ n'ime ndị a pụtara ma onweghị ihe mere ha , mana abụọ n'ime ha merụrụ ahu.
Onye ntaakụkọ sị ụlọ ntaakụko ọzọ na-ekwu na ọsọ ụmụaka ise ka a kpọpụtara, ka otu ka nọ n'ime onunu.