You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
EEDC: Anyị akpaghị mita ọkụ aka
Ngalaba na-eke ọkụ latrik na mpaghara Enugu nke a kpọrọ Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) na bekee agọrọla aka ha n'ebubo ndị mmadụ na-ebo ha na ha na-apịgharị mita ọkụ kwụọ-ụgwọ-ka-isi-mụọ ọkụ (prepaid meter) ha aka maka iji rite oke uru.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Emeka Ezeh, gọrọ agọ a n'ajụjụọnụ ya na ndị ụlọọrụ ntakụkọ, News Agency of Nigeria, nwere n'Aba.
Ọ sịrị n'ụlọọrụ ha amaghị ọrụ gbasara idogharị mita.
Okwu ọnụ ya: "Nke a abụghị eziokwu. O nweghị onye ọrụ anyị ma anya ndogharị mita - belụsọ n'onye ahụ ọchọrọ imebi ya - maka na mita ha bụ nke ndị agba ọhụrụ.
"Ikekwa, o nwere ndị ọrụ anyị achọghị ka ha mee ka obi jụọ ndị mmadụ oyi n'ihe gbasara ịnara mita ọhụrụ ahụ."
"Cheta na ọ bụrụ n'onye ọbụla nwe mita ọkụ kwụọ-ụgwọ-ka-isi-mụọ ọkụ, agaghị enwe ohere igbubi ọkụ kwa ọnwa, belụsọ ma onye ahụ ewepụrụ ọkụ na mita ya."
Ọ kọwara na ọ marala ụfọdụ ndị ụlọọrụ ha ahụ ịnapụ ndị mmadụ akwụghị ụgwọ ọkụ ego aka azụ. Mana, mita ọhụrụ ga-eweta nke a n'isi njedebe'.
Ezeh gwara ndị mmadụ ka ha kpesa onye ọrụ ha ọbụla kpara mita ha aka ka a taa ya ahụhụ kwesịrị ekwesị.
Ọ tụnyere ha alo ka ha na-agbanyụ ọkụ ha na ihe ọbụla ji ọkụ arụ ọrụ iji mee ka ha ghara ị na-emefu ego.