Aju Mbaise: O nwere uru dị n'ịṅụ ọgwụ mgbọrọgwụ a?

Ajụ Mbaise bụ mgbọrọgwụ na akwụkwọ si Mbaise n'Imo steeti nke ọtụtụ ndị Igbo ji esi ọgwụ a na-enye nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ.

Ndị na-aṅụ ya kwuru na ọ na-asacha afọ nwaanyị, wepụ ọbara ọjọọ fọrọ n'afọ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ma mee ka ọ takpọ.

Ụfọdụ sị na ọ na-agwọ ọrịa shuga nakwa ụfọdụ ọrịa ndị ọzọ.

Ahụmihe nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ gbasara Ajụ Mbaise

Chinagorom Osuji bụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ nke nne ya bịara ile ya ọmụgwọ ma wetara ya ọgwụ a bụ Ajụ Mbaise.

Nne Chinagorom bụ Regina Osuji gwara BBC Igbo na ya ji ọgwụ ahụ ga leta nwa ya nke mụrụ nwa n'oge gara aga.

"N'oge ahụ, nwa m nwaanyị ahụ na-enwe ụfọdụ nsogbu afọ dịka ọ mụchara nwa, mana oge ọ malitere ịṅụ ọgwụ a, nsogbu ndị ahụ hapụrụ ya," Regina kwuru.

Ọ kọwara na ọ bụkwa ndị mmadụ nyere ya ndụmọdụ gbasara ọgwụ ahụ mere o ji mata ya.

Nwa ya nwaanyị bụ Chinagorom gwakwara BBC na kamgbe ọ malitere ịṅụ ya bụ ọgwụ, na ya achọpụtala ụfọdụ ihe dị iche n'ahụ ya.

"O nyeere m aka ka ọbara ọjọọ ndị dị m n'afọ gbachapụ, mekwaa ka afọ m buru ibu gbadaa."

Mana kedu ihe ndị dokịnta chere maka ya?

Mana Dọkịta Ngozi Obi bụ ọkachamara maka ahụike ụmụnwaanyị kwuru na ha anaghị adụ ụmụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ọdụ ka ha na-aṅụ ọgwụ mgbọrọgwụ.

Ọ kọwara na ọgwụ ndị a nwereike ịmetụta ụmụnwaanyị ahụ nakwa nwa ha n'ụzọ adịghị mma, kwukwaa na o nwere ike ịmetụta mmiri ara nwaanyị.

"Ahụ mmadụ nwere usoro nke ya oji ewepụ ọbara ọjọọ n'ahụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ," Dkt Ngozi kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na Ajụ Mbaise nwere ike ịrụ ọrụ, mana amaghị kpọmkwem ole nwaanyị kwesịrị ịṅụ ya ka ọ ghara ịṅụfe ya oke.

"Ị ṅụfee ya oke, o nwere ike ịmetụta akịrị maọbụ umeji mmadụ," ka ọ kọwara.

"Onye ọbụla na-aṅụ ụmụ ọgwụ mgbọrọgwụ dịka Ajụ Mbaise na ndị ọzọ kwesịrị ịkpachapụ anya nke ọma.

Kirie akụkọ a n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.

Ndị mere ya bụ Uche Akaolisana Chiemela Mgbeahuru.