You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abaribe: O nweghị ihe e kenyere Ndịgbo na mbibi $22.7b mana ha ga-eso agwụ ya
Senatọ Enyinnaya Abaribe akọwaala ihe mere ya na onyeisi ụlọmeiwu Seneti jiri dọrịta okwu banyere mbibi $22.7b gọọmenti etiti nke OnyeisialaMuhammadu Buhari nọ n’isi chọrọ ịgba na mba ọzọ.
Ọ gwara BBC Igbo na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ anyị nwere n’ekwenti na ụfọdụ ihe enweghị ihe a ga-atụ aka aga-eji ego ahụ mee.
O kwukwara na ndịgbo enweghị oke ọbụla e kenyere ha n’go ahụ a chọrọ ibite mana ha ga-eso kwụọ ya bụ ụgwọ ma oge ya ruo.