Festus Adedayo: Ihe mere ndị na-akwado Buhari ji chọọ ka a chụọ nwa amadi a n'ọrụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọtụtụ na-akwado ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC akpọọla oku ka a chụtuo Festus Adedayo n'ọrụ.

Adedayọ bụ onye ntaakụkọ 'Nigerian Tribune' bụrụkwa onye a ma ama na-akatọ ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buharị.

N'ụbọchị Tuuzdee, onyeisi ụlọomeiwu ukwu bu Ahmad Lawan họọrọ Adedayọ dịka ọnụ ga na-ekwuru ya.

Nke a atọghị ndị otu APC ọchị ma ncha n'ihi na ha sịrị na o kwesịghị ekwesị na ọ ga aghọrọ mkpụrụ ebe ọ na-akụghị.

Ọtụtụ n'ime ha kwuru na Adedayo bụ ọnye iro APC ya mere o ji jọgbuo onwe ya na ọ ga esoro ha na-emekọ ihe.

Ha malitere kesawa ihe ọjọọ niile Adedayọ dere gbasara Buhari nakwa APC n'oge gara aga.

Lee ihe ndi ha dere:

@cbngov_akin1 kwuru na nhọrọ a họọrọ Adedayo bu ihe mkparị nye ha bụ ndị otu APC.

@EmerieUduchukwu kwuru hoohaa na Adedayo kpọrọ APC asị nke na onweghi ihe ọma ga-esi n'aka ya apụta.

@tuwo_mai kwukwara na Adedayo ga na-agbara ndị iro APC ama.

Mana @CitizensUpdate kwuru na aha Adedayo adịkwaghị na akwụkwọ nke gosipụtara ndị Lawan were n'ọrụ.

Akụkọ ga-amasị gị: