Nnamdi Kanu: Israel agọrọla ụkwụ na aka ha gbasara ya

Ma Izrel, ekwuola na onweghị nkwekọrịta ọbụla ha na Nnamdi Kanu nwere.

Ọnụ na-ekwuru ala ahụ bụ Emmanuel Nahshon gwara BBC na e nyochala akwụkwọ ha ma chọputa na o nweghị onyeọbụlụ dịka Nnamdi Kanu nọrọ n'ala ha ugbua.

Ha na-ekwu na ihe nkiri gosiri Nnamdi Kanu n'ala ha nwere ike ibu nke a setere n'oge garaaga.

Cheta n'ime ozi Nnamdi Kanu zipuru n'ụbọchị ole na ole garaaga, o kwuru na o si mba Izrel na-ezipu ozi ebe o kwuru na Ipob ka kwusiri ike na ebumnuche ha gbasara ịnweta ala Biafra.

Ozi Nnamdi Kanu

N'ime ozi Nnamdi Kanu zipuru ọ na-ekwusi ike na ọ bụghị eziokwu na ọ nupuru isi n'iwu oge ya na ndị otu ya na-eme ọgbakọ na bee ya n'ụbọchị ahụ ndị agha biara agha egwu eke.

Cheta n'ime ọnọdụ ụlọikpe nyere ya tupu ha atọghapụ ya na mkpọrọ, ha kwuru na o kwesighị ime ọgbakọ ọbụla gbasara Ipob na bee ya n'ala Igbo maọbụ n'ebe ọzọ na Naịjirịa.

Mana ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor gwara BBC Igbo na ọ dịghị n'aka ndị ọchịchị obodo iji ohere zipuo ndị agha Naịjirịa makana okwu a ka dị n'ụlọikpe.

Ọ zakwara ọtụtụ ajụjụ ndị ọzọ.

Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụzi ugbua bụrụ, gịnị ka Nnamdi Kanu ga-eme ọzọ site ugbua na-aga n'ihu?

Onye nyere BBC ikike i were ozi Nnamdi Kanu zisa ụwa bụ Elliot Ugochukwu-Uko.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị