Akụkọ kachasị n'abalị a: Agaghị enwe ụbọchị ezumike ụbọchị Juunu 12 afọ a
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:
Gọọmenti etiti ekwuola na a gaghị enwe ụbọchị ezumike n'abalị iri na abụọ ọnwa Juun nke afọ a.
Cheta na onyeisiala nyere iwu na ụbọchị ahụ ga-abụzị ụbọchị ọhụrụ a ga na-eme ncheta ọchịchị onyekwuoucheya.

Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa
Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyela aka n'akwụkwọ iwu ga-enye ụlọomeiwu steeti na ụlọikpe steeti nnwere onwe n'okwu gbasara ego na ihe ndị ọzọ.
Nke a bụ akwụkwọ iwu mgbanwe nke anọ a na-eme n'akwụkwọ iwu Naịjiria.

Ebe foto si, @bashirahmad
Akụkọ mba ofesi
Ụlọikpe mbaụwa bụ International Criminal Court na bekee atụgharịala ikpe ha mara onye bụbu osote onyeisiala mba Kongo bụ Jean-Pierre Bemba.
A maburu Bemba ikpe n'afọ 2016 maka arụ a kpara megide ndị mmadụ na mba sentralú Afrika Rípúblik n'afọ 2002 rue 2003 mana onye ọkaikpe ọzọ ekwuola na agaghị amali ya ikpe maka ihe ndị ọjọọ mere.

Ebe foto si, AFP
Trump ekwuola na ihe a na-egosi ihuoma Nọt Koria bu n'obi ma kwukwa na enwela ụbọchị na ebe ya na Kim Jong un ga-enwe nzụkọ.
N'egwuregwu,
Otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ mbaụwa bụ Fifa amachiela onyeisi egwu bọọlụ nke Gana bụ Kwesi Nyantakyi maka na ọ nara aka azụ.
Fifa machiri ya ime ihe ọbụla gbasara egwụregwụ bọọlụ abalị iri itoolu ebe Ghana kwuru na ọ ga agbasa otu egwu bọọlụ ya maka mpụ ahụ.

Ebe foto si, Film
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:











