Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Mikel Obi na Kelechi Iheanacho kwuru na ha mara Ingland nke ọma
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Nnukwu ụgbọala akwọriela nwaanyị ku nwa na mmadụ isii ndị ọzọ n'Owerri

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwaanyị ku nwa n'aka na mmadụ isii ndị ọzọ etufuola ndụ ha n'ihe mberede okporoụzọ mere n'Owerri.
Ndị ọrụ nchekwa FRSC kwuru na nchọpụta ha na-atụ onye kwọ nnukwu ụgbọala kụrụ ụgbọala mmadụ iri na isii si Ọnịcha nọ n'ime ya.
Naịjirịa
Ndị ọchịehi a ga-abụ otu na-eyi ọha egwu ka ha agahị abụ?

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe etiti nọ n'Abuja ga-amalite ụbọchị iri na abụọ ọnwa Juunu ileba anya ka a ga-akpọ ndị ọchịehi otu na-eyi ọha egwu.
Ọ ga-elebakwa anya n'akwụkwọ e degara ya ka ha kwụsị ndị ọchịehi ịchụ ehi na Benue steeti maka mkpamkpa ha na-akpa eba ahụ.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Ọgbaghara mere n'APC Ekiti steeti chọrọ ịta isi Fayemi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Otu APC ekwuola na ọgbaghara mere n'Ekiti bụ onye bụbu gọvanọ steeti ahụ bụ Kayode Fayemi ka a chọrọ igbu.
Fayemi hapụrụ ọkwa ya dịka mịnịsịta na-ahụ maka ngwụputa ịga zọọ gaọvanọ ọzọ n'Ekiti.
Akụkọ mba ofesi
Kenya chọrọ ịhụ na ndị ọrụ ha niile bụ ndị na-ekwu eziokwu.

Ebe foto si, AFP
Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyatta ekwuola na ndị na-achọ ọkwa ọchịchị na gọọmenti ya ga-agafe mashine na-enyocha asị.
Kenyatta kwuru na nke a bụ iji nyochaa ndị ọrụ ha maa chụkwa mpụ ọsọ.
N'egwuregwu,
Naịjirịa na Ingland ga-akwata ya na ọgbọ Wembley taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Dịka Naịjirịa na Igland ga-agba asọmpi enyi na enyi taa, Mikel Obi na Kelechi Iheanacho kwuru ka a wụsara ha ọwara maka ya bụ asọmpi.
Ha kwuru na nke a bụ maka na ha mara mba Ingland nkeọma ebe Mikel gbaburu Chelsea ma Iheanacho na-agbara Leicestere City bọọlụ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa: