Ahụ osiri gị ike ịgba ọsọ na Lagos Maratọn na-abịa?

Ebe foto si, Getty Images
Ka ndị gọọmentị Lagos Steeti na ndị mmadụ na-akwado ọsọ maratọn nke afọ 2018, ajụjụ bụ 'kedụ ihe a ga-eme ma mmadụ kubie ume ebe ọ na-agba ọsọ?'
Tupu ịkwado ịgba ọsọ maratọn na Lagos Steeti, jụọ onwe gị ma ahụ osiri gị ike ịgba ọsọ a?
Ụfọdụ ndị mmadụ anwụọla ka ha na-eme ihe siri ike dịka ịgba ọsọ, ịgba bọọlụ maọbụ ịgba egwu dgz.
Nke a kpatara o ji adị mma ilekọta onwe gị mgbe niile.
Ọ bụ mmadụ niile ga-agbanwu ọsọ a?
Otu dọkịta a na-akpọ Dami Ajayi gwara BBC sị, "Onye ọbụla ma n'ịgba ọsọ maratọn bụ egwuregwu tara akpụ. Ọ dị ezigbo mkpa ka ndị mmadụ nyochaa onwe ha n'ụlọọgwụ tupu ha abanye ịgba ụdị ọsọ a."
Igosi na ihe dọkịta kwuru bụ eziokwu, ndị Lagos City Maratọn dọrọ aka na ntị sị na onye ma na ahụ esighị ya ike maọbụ na o nwere ọrịa dị ka ọrịa shuga maọbụ ọrịa na-eme ka chi jie n'ehihie (blackout), na ọ ga-aka mma dee obe n'ihu ọnụ ọgụgụ amadoro n'uwe gị ma detukwa ọgwụ gị n'azụ ya.
Ha kwukwara sị ka ndị mmadụ gbaa mbọ ga nyocha ahụ n'ụlọọgwụ ka enyoputa ma ha enwere ọrịa obi ọbụla.
Ọdachi dapụta kwanụ?
Ndị Lagos City Marathọn kwuru na ha dị njikere imezu atụmanya ndị mmadụ gbasara ọdachi nwere ike ịdapụta maka ahụike ndị mmadụ.
Ha kọwara nke a n' igwe okwu websait ha ebe ha depụtara ụzọ niile ha ga-esi ahụ na onweghi akụkọ ọjọọ ga-adapụta.
Maka nkwado ịgba ọsọ a, ha kwuru sị ndị mmadụ adọgala onwe ha karịa otu ike ha dị kama ha jiri nwayọ nwayọ na-akwado ka ọrịa ike ọgwụgwụ (exhaustion) hapụ ime ha. Asịkwa ha gbalịa na-aṅụ mmiri ọfụma ma rikwaa nri ọfụma. Ha sịkwa ha gbaa mbọ zuo ike ọfụma.
Ụzọ ha ga-esi elekọta mmadụ
Ha kwuru sị na ha ga-edewe ebe ndị merụrụ ahụ ga-anọ nwete nlekọta n'ebe dị iche iche site na mbido ụzọ esi agba ọsọ ahụ ruo na ngwụcha ya.
Ha ga-edewekwa ebe a na-aṅụ mmiri na mita narị abụọ ọbụla, ya na ebe a na-eri nri nke ga-adị n'akara-ngwụcha.
Ụgbọala eji ebu ndị ahụ na-adịghị (ambulance) ga-anọkwa ebe ahụ maka ibuga onye ọbụla ihe na-emesi ike ụlọọgwụ.










