Ịgba ọgwu mgbochị yellow fiva ebidola na Naijiria na Brazil

Yellow fiva

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Naịjirịa so na obodo ndị ka nwere ọrịa yellow fiva na ụwa niile. (Foto a si na Congo mgbe yellow fiva batara mba ahụ na 2016)

Naijiria na Brazil na akwado ibido ịgba ọgwụ ga egbochi ọrịa yellow fiva - bu ọrịa anwụta na-ebute, bụkwara nke na egbụ mmadu kariri puku iri kwa afọ na ụwa niile.

Na Naịjirịa, ana atụ anya na mmadụ ruru nde iri abuo na ise ga nata ọgwu mgbochi na afọ a.

Ndị Brazil na egbuso agha nke ha maka ujo ha nwere na yellow fiva ga abanye obodo dị ichiche na mba ahu.

Tarik Jasarevic, bụ onye na-arụ ọrụ World Health Organisation, bụ ndị na ahu maka ihe gbasara ahu ike na ụwa niile, kọwara otu mba abuo a sịrị na ebuso yellow fiva agha na ụzọ dị ichiche.

"Ịgba ọgwụ mgbọchi na Naịjirịa a na akwado n'afọ a bụ usoro na ụzọ Naijirịa tinyere ịhụ na ụdị ọrịa ga erị nnụkwụ ọgwụ mgbochi adịghịzị," Jasareviv kwuru.

Ọ sịrị na Brazil, ọgwụ ana agba bụ n'ịhị na ya bu ọrịa pụtara na mba ahu ugbua:

"Ndị a ga agba ọgwụ na Brazil ugbua agaghị eri ọtụtụ ọgwụ. Ọgwụ ndị Brazil ga enye mgbochi ga eru otu afọ."

Naịjirịa ka so na mba ndị ka nwere yellow fiva, ihe a mere onye ọbula si Naịjirịa na eje obodo ọzọ a ga jụ ya maka akwụkwọ zikọrọ na ọ gbaala ọgwụ mgbochi a.

Yelo fiva anaghị ewu ụgbua, mana lassa fiva bu ọrịa nke a na-akọwa na ọ dị na steeti iri na Naịjirịa nke taa.