Ndị Nyocha: Yabasị a ga-enye aka ịlụso nje na-ebute ọya ụkwara ọgụ

yabasi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A na-eji udi yabasi a esi nri na mba Iran.

Nchọpụta egosila na e nwere ụdị yabasị ga-enye aka iluso nje na-ebute ọrịa ụkwara a na-akpọ Tuberculosisi -- TB na aha ịchafụ -- ọgụ.

Ndị na-eme nchọpụta na-ekwenye na ihe na-aluso nje ọgụ ha wepụtara na ya bụ yabasị a na-akpọ Persian Shallot nwere ike inyere ọgwụ ndị ozo eji achụ nje ọsọ aka.

Ha kwuru na akụrụngwa dị na yabasị a nwere ike inye aka gbasara nkwechiri ọgwụ TB na-eme, metutagoro ihe ruru mmadụ puku narị anọ na itoolu n'afọ 2016.

Mana ha kwuru na ugbu a ka bụ ụtụtụ na nchọpụta ahụ ha na-eme, maka ha ka ga eme nyocha n'ụlọ ọgwụ.

TB

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Ndị nyocha kwekọrịtara na ịhe ndị dị na yabasi a ga-emepe ụzọ iji chọpụta ọgwụ ọhụrụ gbasara TB