Chris Kehinde Nwandu: Iwu m dara kpụgara m n'ụlọ mkpọrọ

Chris Kehinde Nwandu akọwala etu Cyber Crime Law nke ewepụtara n'afọ 2015 siri metụta ya.

Ọ kwuru na ndị mmadụ amaghị maka iwu a nke mere na ọ bụ ọnya na-amakarị ndị ntaakụkọ.

Nwandu kwuru na agbanyeghi na Naịjirịa nọ n'ọchịchị onye kwuo uche ya, ekwesiri ịnyocha iwu a iji nyere ndị ntaakụkọ aka ịrụ ọrụ ha n'atụghị egwu.