You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Christchurch: Buo agha megide iyi ndụ egwu n'ụwa niile- Jacinda Arden
Praịm Mịnịsta mba Nu Ziland bụ Jacinda Ardem akpọọla oku ka mba ụwa niile buo agha kpochapụ iyi ndụ egwu.
Ọ kpọrọ oku a na mkparịtaụka ya na BBC nwere banyere mwakpo e mere n'ụlọ okpukpe ndị alakụba nke a gbagburu mmadụ iri ise.
Ardern kwuru na ịkpa oke bụ ihe ririla ọtụtụ mba ụwa isi na ọ bụghị naanị otu mba ga-enwe ikike ikpochapụ.