Ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ na-ede ule WAEC n'Aba dị n'Abịa steeti akọwaala ihe ha
gabigara n’ụbọchị Wenezde 28 Mee 2025, bụ ụbọchị ha dere ihe ọmụmụ asụsụ Bekee.
Otu nwataakwụkwọ na-ede ule WAEC aha ya bụ Success gwara
onye ntaakụkọ BBC News Igbo na onye nlekọta ha bụ 'invigilator' butere akwụkwọ
ule nke abụọ bụ ihe ọmụmụ asụsụ Bekee mgbe ọ kụrụ elekere ịse nke mgbede.
O kwuru na ha dechara ule ahụ n'ihe dịka elekere asaa nke
abalị, ebe ha jizi ọkụ tọọchị nakwa ọkụ ekwentị ndị nkụzi ha na-ahụ ihe ha
na-ede mgbe ọchịchịrị gbara.
Nwataakwụkwọ ahụ kwuru na ya bụ ọnọdụ tinyere ha na
mgbagwojuanya, dịka ọ na-atụ egwu na nke a nwereike imetụta akara ha n'ule ahụ.
Otu onye nkụzi aha ya bụ Maazị Uche Imeuka gwara anyị na ụmụakwụkwọ
na-ele ule lechara mgbe ọ kụchara elekere asatọ nke abalị.
O kwuru na ihe kpatara nke a bụ na e butere akwụkwọ ule mgbe
ọ gafechara elekere isii, nke meziri e jiri malite ya bụ ule n'azụ oge.
O kwuru na e tinyeziiri ụmụakwụkwọ ọkụ ka ha jiri hụ ụzọ
dechaa ule ha.
N'ebe ụfọdụ, ụmụakwụkwọ kwuru na a mụnyeere ha ọkụ oriọna ka
ha jiri hụ ụzọ na-ede ule.
Onye ntaakụkọ BBC News Igbo n’Aba dị n’Abịa steeti sị ya hụrụ
ka ụmụakwụkwọ na-ede ule nọ n'okporoụzọ na-ala mgbe ọ kụrụ ihe dịka n'elekere
iri nke abalị n’ụbọchị Wenezde ahụ.
Ọnọdụ a metụtara ụmụakwụkwọ niile dere ule n'ụbọchị ahụ.
Ka o sina dị, ụlọọrụ West African Examinations Council
(WAEC) ekwuola na ọ bụ nsogbu ime njem na ọnọdụ enweghị nchekwa mere ha jiri
haziere ụmụakwụkwọ ule n’azụ oge n’ụbọchị Wenezde 28 Mee 2025.
N’ozi o wepụtara, ọnụ na-ekwuru WAEC bụ Moyosola Adeshina kọwara
na dịka ha mechichara oghere niile, ha zutere nsogbu ime njem nakwa nsogbu
nchekwa, bụ nke mere e ji hazie ule ahụ n’azụ oge.
WAEC kwere nkwa na ha na-agbakọrọ ụlọorụ nchekwa dị iche
iche aka iji hụ na ụdị mkpọbiụkwụ ahụ adapụtaghị ọzọ.
Ụlọọrụ ahụ jikwa obi ha niile rịọ ụmụakwụkwọ, ụlọakwụkwọ
nakwa ndị nne na nna mgbaghara maka ọnọdụ ahụ.