Gọọmenti etiti
site n’ụlọọrụ onye ndụmọdụ nchekwa ekwuola na ha azụpụtala ndị ọrụ nchekwa ‘forest
guard’ dị puku asaa site na steeti asaa bụ ebe nchekwa kachasị dị njọ na Naịjirịa.
Nke a site
n’ozi onye ndụmọdụ pụrụiche nke Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Rabiu Ibrahim
wepụtara n’ụbọchị Satọde 27 Disemba 2025.
O kwuru na ndị
a natara ọzụzụ kara aka n’ime ọnwa atọ site na ntuziaka Onyeisiala Bola Tinubu
nke a kpọrọ ‘Forest Guard Initiative’ nke o hiwere n’ọnwa Mee afọ 2025.
O kwuru na atụmatụ a gụnyere ndị ọrụ nchekwa Gọọmenti etiti
na gọọmenti steeti nke ọrụ ha bụ iwere ọnọdụ n’ime ọhịa Naịjirịa ma kpochapụ ndị
omekome jiri n’ime ọhịa ndị a.
E duru ndị a n’iyi ọrụ n’emume e mere na steeti dị iche iche
gụnyere Borno, Sokoto, Yobe, Adamawa, Niger, Kwara, na Kebbi Steeti n’ụbọchị 27
Disemba 2025.
E hiwere atụmatụ a maka ibu agha megide ndị na-eyi ndụ egwu,
ndị ekperima, ndị ntọrị ndị omekome ndị ọzọ ma wulite ọnọdụ nchekwa n’ime obodo
Naịjirịa.
Ibrahim kwuru na e nyere ndị a ọzụzụ dị iche iche gụnyere izọpụta
ndị a tọọrọ, ipiogharị n’ime ọhịa, ngalaba ahụike, ụbụrụ ịsị nakwa ihe ndị ọzọ
onye ọrụ nchekwa kwesịrị ịma.
Cheta na Onyeisiala Tinubu nyere ngalaba nchekwa DSS iwu ka
ha zụpụta ma ziga ndị nchekwa ‘forest guard’ n’ime ọhịa dị na Naịjirịa iji
kpochapụ ndị omekome.
O nyere iwu mgbe o tinyere ọnọdụ gbata gbata na ngalaba
nchekwa na Naịjirịa site n’oke ntọrị ndị mmadụ n’ọnwa Nọvemba gụnyere ụmụakwụkwọ
na Kebbi Steeti, ndị ụka na Kwara Steeti nakwa ụmụakwụkwọ na Niger steeti.