E bidola nnyocha ihe kpatara ụgbọelu jeetị na helikọpta ji suo onwe ha n’Amerika
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere
China ekwuola na ha ga-etinye ụtụisi na ngwaahịa nke ha iji megwara Amerịka
Ebe foto si, BBC, EPA
Chaịna
ekwuola na ha ga-emegwara dịka ụtụisi ọhụrụ Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump
gbakwunyere na ngwaahịa malitere dịwa ire.
Ihe ndị Chaịna
ga-agbakwunye ụtụisi bụ ngwaahịa ndị e si Amerịka tụbata na mba ahụ, ndị gụnyere
kool, ụgbọala ndị nwere nnukwu njini nakwa gaasị.
Ụlọọrụ mba
Chaịna na-ahụ na onye niile nwere ikike ịmaaka azụmaahịa amalitela ime nnyocha
gbasara ụlọọrụ Google.
Ego ọhụrụ dị
10% Trump gbakwunyere na ngwaahịa si mba Chaịna amalitela dịwa ire dịka ọ kwụsịtụrụ
25% ọ gbakwunyere na ngwaahịa ndị si mba Kanada na Meziko ruo otu ọnwa.
A họpụtala Sịnetọ Orji Uzor Kalu dịka onyeisioche kọmitii ụlọomeiwe sịneti na-ahụ maka South East Development Commission.
Ụlọomeiwu Sịneti
Naịjirịa ekwuputala Sịnetọ Orji Uzor Kalu na-anọchiteanya Abịa Nọt dịka
onyeisioche kọmịtii ụlọomeiwu sịneti na-ahụ maka South East Development Commission (SEDC).
South East Development Commission (SEDC) bụ otu n’ime ụlọọrụ na-ahụ maka mmepe
mpaghara Naịjirịa dị iche iche Onyeisiala Bola Tinubu binyereaka ka ọ bụrụ iwu.
A họpụtakwara Sịnetọ
Ken Eze si Ebonyi steeti dịka osote onyeisioche kọmitii ahụ, ebe onyeisi ụlọomeiwu
Sịneti bụ Godswil Akpabio kwuru na ọ ga-akpọpụta aha ndị ọzọ so na kọmitii ahụ
n’oge na-adịghị anya.
Nhọpụta a pụtara
na Sịnetọ Kalu na ndị kọmitii ahụ ga-arụ ọrụ iji hụ na South East Development
Commission mịtara mkpụrụ e
ji maka ya hiwe ya nke gụnyere inweta ezi nchekwa, igbochi mbuze, iwulite nrụpụta
nakwa ihe ndị ọzọ.
Ihe ruru mmadụ 10 anwụọla oge e nwere nkwakọrịta mgbọ n’ogige ụlọakwụkwọ Risbergska dị na Sweden
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị uweojii
Ndị uweojii ekwuola na ihe ruru mmadụ iri nwụrụ n'oge e nwere nkwakọrịta mgbọ n’ogige ụlọakwụkwọ Risbergska dị na mba Sweden.
Ha sị na ha nwere nkwenye na onye bidoro mkpamkpa
ahụ so n'ime mmadụ iri ahụ nwụrụ.
Ha na-akọwa na ọ dịka ọ bụ naanị otu onye kparankata
ịkpa mkpamkpa ahụ mana ihe mere o jiri kpaa udịrị nkata ahụ edobeghị anya ugbua.
Nkwakọrịta mgbọ ahụ mere n'ogige ụlọakwụkwọ Risbergska dị n’obodo a na-akpọ Orebro na mba Sweden.
Onyeisi ndị
uweojii n’Orebro aha ya bụ Roberto Eid Forest kọwara na ha ezigala ọtụtụ ndị
uweojii n’ime ụlọakwụkwụ ebe ọgbaaghara ahụ dara.
Roberto kwuru na n’ime mmadụ ise mgbọegbe
tụrụ na ọ dịka otu onye n’ime ha bụ ya bidoro ịgba ndị ọzọ egbe.
Ọ sị na ugbua,
ndị uweojii amalitela ime nyocha ihe na-eme ebe ahụ ma gwa ndị mmadụ ka ha hara
ịga na gburugburu mahadum ahụ.
Mana Jonas
Claesson na-anọchịta anya ndị ụlọọgwụ sị na e bugara ndị ahụ niile mgbọ tụrụ n’ụlọọgwụ
ha, mana otu onye n’ime ndị ahụ meruru ahụ nke ukwuu.
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Praịm mịnịsta mba Sweden bụ Ulf Kristersson
Praim mịnịsta
mba Sweden bụ Ulf Kristerssonkatọrọ ọgbaaghara kpatara nkwakọrịta mgbọ na mahadum ahụ ma kọwaa ihe mere dịka “ihe ụfụ dịaara
ụmụamaala mba Sweden”.
Praịm Mịnịsta kwuru na ndị uweojii ka na-eme nyocha banyere ihe mere ma dụọ ohanaeze aka na
ntị ka ha rube isi na ndụmọdụ ndị uweojii nyere ha na gburugburu ebe ahụ.
Ebe foto si, EPA
Nkọwa foto, Ndị uweojii
Ugbua anyị na-enweta ozi na mmadụ isii nọ n’ụlọọgwụ ugbua mana mmadụ anọ n’ime ha ka a wagoro ahụ, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ ka a na-asị na ha meruru obere ahụ.
Hamas atọhapụla ụmụ amaala mba Izrel abụọ
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Oge ndị Hamas nyefere Ofer Kalderon n'aka ndị Red Cross
Ndị na-enyi ọha egwu bụ otu Hamas atọhapụla ụmụ amaala mba Izrel mmadụ
abụọ ha tọọrọ.
Aha ndị Izrel mmadụ abụọ ndị ahụ bụ Ofer Kalderon na Yarden Bibas.
Ugbu a, ha abụọ nọ n’ime oke ala
mba Izrel ka ndị ndị Hamas sita n’aka ndị ọrụ gbatagbata Red Cross nyefere ha n’aka
gọọmentị mba Izrel.
Ndịagha mba Izrel kwuru na Ofer na
Bibas na-aga na mpaghara Izrel bụ ebe a ga-anabata ha.
N’aka nke ọzọ, Gọọmenti mba Izrel
ga-atọhapụ ndị Palestinian mmadụ 183 ha tụrụ nga.
Mmadụ 100 n’ime ndị Palestine ahụ si
na mpaghara Gaza ebe ọtụ n’ime ka a na-ekpe ikpe ọnwụ n’ime mba Izrel.
Ụgbọala akụgbuola otu onyeagha, merụọ ndị ọzọ ahụ na Legos
Ebe foto si, @HQNigerianArmy/X
Nkọwa foto, Ndịagha Naịjirịa na-azọ njem
Ụgbọala akpọkaala ndịagha na-azọ njem ha na-adị eme ugboro abụọ n’afọ ọbụla, kụgbuo otu onye ma
merụọ ndị ọzọ ahụ.
Ozi isi ụlọọrụ
ndịagha Naịjirịa wepụtara site n’aka Olabisi Olalekan Ayeni kwuru na ọdachi ahụ
mere n’ụtụtụ Fraịde 31 Jenụwarị 2025 n’akụkụ Myhoung Barracks dị na Yaba nke
Legọs steeti.
O kọwara na
njem ahịrị ahụ bụ nke a haziri iji kwalite ikike ndịagha gburugburu Legọs
steeti ma bụrụkwa nke a mara ọkwa ya n’ụlọmgbasaozi dị iche iche.
Ayeni kwuru
na ihe ọdachi ahụ mere mgbe onye ọkwọụgbọala gbaara ọnwụ ọnwụ kpọkaa ndịagha
ebe ha na-azọ njem ma gbuo otu onyeagha dịka ndị ọzọ nwetara ogogo mmerụahụ
dị iche iche.
Ozi ahụ
kwuru na a dọnyela ozu onyeagha nwụrụ anwụ n’ọbaozu ebe ndị nke merụrụ ahụ
na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ndịagha 68 Nigerian Army Reference Hospital dị na Yaba,
Lagọs steeti.
Ozi ahụ
gara n’ihu kwuo na Ọchịagha na-elekọta ngalaba ụlọọrụ ndịagha 81 Division bụ
General Farouk Mijinyawa ezigaraala ezinaụlọ onyeagha nwụrụ anwụ ozi nkasiobi
ma kpeekwa ekpere ka ndị nke merụrụ ahụ gbakee ngwangwa.
Ka o sinadị,
ọ kpọrọ oku ka onye niile dere duu n’ihi na ndịagha amalitela ime nnyocha iji chọpụta
ebe mmiri siri banye n’opi ụgbọghọrọ.
Minista eboola Rụwanda ebubo iweghara DR Kongo n'ụzọ iwu akwadoghị
Ebe foto si, Getty Images
Minista
na-ahụ maka mba ofesi na DR Kongo bụ Thérèse Kayikwamba Wagner eboola Rụwanda
ebubo iweghara Democratic Republic of Congo na ịkpalite nkwatu ọchịchị dị ugbu
a.
Ọ gwara BBC
na nke a sochiri ọtụtụ iri afọ nke enweghị ntaramahụhụ na enweghị ike ijide
Onyeisiala Rwanda bụ Paul Kagame maka imebi iwu mba ụwa.
O kwuru nke
a mgbe ndị nnupụisi M23 Rwanda na-akwado weghara obodo Goma nke ọwụwa anyanwụ
Kongo ma yie egwu ịga n'ihu na mwakpo isi obodo Kinshasa.
Ọnụ
na-ekwuru mba Rwanda bụ Yolande Makolo gọnarịrị ebubu a ma kwuo na ha zigara ndịagha
obodo ha maka ịhụ na-agha abataghị n’obodo ha.
"Anyị
enweghị mmasị na agha, anyị enweghị mmasị na mgbakwunye, anyị enweghị mmasị na
mgbanwe ọchịchị," Makolo gwara BBC.
Otu
mpaghara nke nwere mba iri na isii dịka ndị otu ha bụ South Africa Development
Community (Sadc), ga-enwe nzukọ pụrụ iche na Fraịde na Zimbabwe iji kparịtaụka
maka ọnọdụ nke DR Kongo.
Otu ahụ
ezipụla ndịagha na-ahụ maka udo, nke sitere na mba Saụt Afrịka, na DR Kongo ka
ha buso ndịagha nnupụisi M23 ọgụ ma weghachi udo na mpaghara nwere ihe ọ natara
chị dị n’ime ala nke dịka ọtụtụ iri afọ ọgbaaghara gasịrị.
Egburu ndịagha
Sadc iri na isii n’ọgụ ha na ndị M23 na gburugburu Goma n'izu garaaga.
Ndịagha nnupụisi ekwela nkwa ịga n’ihu na mwakpo n’isi obodo DR Kongo
Ebe foto si, Getty Images
Onye ndu ndịagha nnupụisi weghaara Goma, obodo kachasị ukwuu n’ọwụwa anyanwụ
Democratic Republic of Congo, ekwela nkwa ịga n'ihu na mwakpo n'isi obodo
Kinshasa.
Onyeisi otu
jikọrọ ndị nnupụisi na mba ahụ bụ Corneille Nangaa, kwuru na ebumnuche ha bụ ịkwatu
ọchịchị onyeisiala Félix Tshisekedi.
Akụkọ kwuru na ndị nnupụisi ahụ nke a sị na mba Rụwanda na-akwado na-aga n'ihu iweghara Bukavu, obodo nke abụọ kachasị nwee ihe ọnatarachi dị
n’ime ala na mpaghara ọwụwa anyanwụ, n'agbanyeghị oku mbaụwa na-akpọ maka ịkwụsị
ọgụ.
Na mgbasaozi e gosiri na tivii mgbe e weghara Goma, Tshisekedi kwuru na
"nzaghachi siri ike na nke a haziri ahazi" na-abịa iji napụta ndị nnupụisi mpaghara ahụ.
O kwuru na
mgbede Wednezde 29 Jenụwarị 2025, na otu ihe ọ maara bụ na mba DR Kongo agaghị
ekwe ka e weda maọbụ zọpịa ya, “anyị ga-alụ ọgụ nweta mmeri".
Dịka ulọọrụ
UN siri kwuo, ọgụ a mere ka ihe dịka mmadụ narị puku ise (500,000) hapụ ụlọ ha,
na-eme ka nsogbu mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-akawanye njọ.
N’ụbọchị Tọzde
30 Jenụwarị 2025, Nangaa gosipụtara ndị nnupụisi ahụ dịka ndị nchịkọta ọhụrụ nke
Goma, ọ gwara ndị ntaakụkọ na ha ga-anọgide ebe ahụ.
E bidola nnyocha ihe kpatara ụgbọelu jeetị na helikọpta ji suo onwe ha n’Amerika
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka, Donald Trump
Kemgbe ụgbọelu jet na helikọta nwere ihe mgbere gburu madụ 64 na mba Amerịka, ndị nnyocha amalitera ịchọ ihe kpatara ya dịka ụlọọrụ National Transportation Safety Board (NTSB) si kwuo.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu sịrị na “anyị amabeghị ihe kpatara ihe mgberede a, mana anyị nwere ihe na-arụtụaka n’etu o si mee”.
Trump kwuru na ọ bụ ka e si enye ọrụ na ngara ụlọọrụ na-ahụ maka ịhazị ụgbọelu na-efeni maọbụ ụgbọelu na-adaa n’ọdụ ụgbọelu nwereike ịkpata ihe mgbere ahụ.
Ebe foto si, NTSB
Nkọwa foto, Ndịọrụ NTSB na-emepe igbe 'black box'
Mana NTSB kwuru na ndị na-eme nnyocha na-etinye anya n’ọtụtụ ihe nwereike ịkpata ihe mgberede ahụ dịka ọnọdụ ihuigwe nakwa ọnọdụ ndị na-ahazị njem ụgbọelu n’ọdụ ụgbọelu ahụ.
Ha sị na ha ga-enyocha ihe gbasara mmadụ ịda mba n’ọrụ ya, nkuzi na ọzụzụ e nyere ndị na-arụọrụ n’ọdụ ụgbọelu ahụ, ọnọdụ gburugburu ebe mkpamkpa ahụ kpara na ihe ndị ọzọ.
Ugbua, ndị nyocha achọtara igbe a kpọrọ ‘black box’ bụ igbe na-egosi ndekọ ihe niile mere n’ụgbọelu ahụ ma bụrụkwa igbe ga-enyere aka ịchọpụta etu ụgbọelu ahụ sị nwee ihe mgberede.
Ebe foto si, NTSB
Nkọwa foto, Onye ọrụ NTSB na-emepe igbe 'black box'
Igbe ahụ ga-egosi ihe niile ọkwọ ụgbụelu ahụ mere, okwu niile o kwuru na nzịkọrịta ọzị dị n’etiti ya na ndị ọlụ n’ọdụ ụgbọelu nakwa ọnụ okwu ndị mmadụ nọ n’ime ụgbọelu ahụ tupuu ọ daa nwere kpọkasịa.
Onyeisiala Trump ekwuola na enweghị onye ma ihe kpatara mkpọka ụgbọelu na helikọpta ahụ gburu mmadụ 67
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu banyere ọdachi ahụ
Onyeisiala
mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na enweghị onye ma ihe kpatara nkpọka Ụgbọelu mba Amerịka na helikọpta ndịagha kpọkara
na Washington DC ma kwuo na a malitela ime nnyocha iji chọpụta ihe butere ọdachi
ahụ.
Mmadụ 64 na-eme njem n’ụgbọelu
American Airlines ahụ ebe ọ bụ naanị mmadụ atọ nọ na helikọpta ahụ, mana ka ọ dị
ugbua, ndị ọrụ na-ekwu na enweghị onye ọ dị ha ka o ji ndụ ya pụta na njiji ahụ.
Onyeisiala Trump na-ebo
ọchịchị Joe Biden ebubo ma kwuo na ọchịchị ya nyere ndị ndị na-etozughị etuzu ọrụ
ịchịkọta ma hazie njem ụgbọelu. Ebubo a bụ nke Onyeisiala Trump na-ewepụtaghị
ihe akaebe ọbụla banyere ya.
Otu ihe ndị na-eme
nnyocha na-eleba anya na ya bụ ihe mere helikọpta ahụ ji efegharị na mpaghara
ahụ. Trump kọwara mpaghara dịka nke na-adịghị mma.
Ozi pụtara ihe si n’igwe
mgabasaozi njem ụgbọelu, kwuru oge ndị ọrụ na-ahazi njem ụgbọelu (air traffic controllers) na-ajụ helịkọpta
ahụ ka ọ na-ahụ ụgbọelu ahụ.
Odeakwụkwọ ụlọọrụ
nchekwa mba Amerịka bụ Pete Hegseth kwuru na nke a bụ ihe na-ekwesighị ime ma rịọ
ka ndị mmadụ nwee ndidi ka e mee nnyocha.
Donald Trump ekwuola na mba Amerịka ga-arụ ụlọmkpọrọ ndị mbịarambịa na Guantanamo Bay
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala Donald Trump mba Amerịka
Onyeisiala
mba Amerịka bụ Donald Trump enyela ịwu ka arụọ ụlọmkpọrọ ndị mbịarambịa nwereike ijide mmadụ puku iri atọ na Guantanamo Bay.
O kwuru na ụlọọrụ ndịagha mmiri Amerịka (US Navy) dị na Cuba, nke ga-anọpụ iche
na ụlọmkpọrọ ahụ ndịagha na-echekwa, bụ a ga-edobe "ndị omekome ahụ kacha njọ
na-eyi ndị Amerịka egwu.
Guantanamo
Bay bụ ebe a na-edobe ndị mbịarambịa ogologo oge, bụ omume nke ụfọdụ ndị mmadụ
katọrọ.
Tom Homan bụ
"border tsar" Trump, kwuru n’ụbọchị Wenezde 29 Jenụwarị 2025, na a
ga-agbasawanye ụlọmkpọrọ ochie bụ ebe ndị ụlọọrụ Immigration and Customs
Enforcement (ICE) ga na-ahụ maka ya.
O kwuru na
e nwereike ibuga ndị mbịarambịa ebe ahụ ozugbo ndị nchekwa US Coast Guard nwụchiri
ha n'oké osimiri.
Trump kwupụtara
nke a dịka o bịnyere aka n'akwụkwọ iwu a na-akpọ Laken Riley Act, nke chọrọ ka
ndị mbịarambịa na-enweghị akwụkwọ bụ ndị nwụchiri maka izu ohi maọbụ mpụ, ga-anọ
n'ụlọmkpọrọ were echere mgbe a ga-ekpe ha ikpe n'ụlọikpe.
Mịnịstrị na-ahụ
maka ahụike na Yuganda ekwuola na ọrịa Ebola etiwapụla n’isi obodo mba ahụ bụ
Kampala.
Ha kwuru na
nnyocha ha mere otu nwaanyị nọọsụ nwụrụ n’ụlọọgwụ dị na Kampala ụbọchị Wenezde
29 Jenụwarị, 2025, gosiri na o bu orịa hemorrhagic fever ahụ.
Ka ọ dị
ugbua, enweghị onye ọzọ na-egosi njirimara ọrịa.
Cheta na ọrịa
Ebola tiwapụrụ na Yuganda ma nọọ ọnwa anọ ma gbuo mmadụ 55 nke gụnyere ndị ọrụ
ahụike n'afọ 2024. Ụlọọrụ World Health Organization na-ekwu na ọrịa Ebola na-egbu mmadụ ise
n’ime mmadụ iri butere ọrịa ahụ.
Benjamin Netanyahu enyela iwu ka e gbuo oge ịtọhapụ ndị Palestine e ji eji
Ebe foto si, Getty/BBC
Ozi anyị
nwetara ugbua na-ekwu na Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu na Minista
nchekwa mba ahụ bụ Israel Katz enyela iwu ka e gbuo oge ịtọhapụ ndị Palestine karịrị
otu narị (100) e ji eji n’ụlọmkpọrọ.
Nke a na-abịa
dịka e gosiri ọnọdụ ọgbaaghara na Khan Younis oge a tọhapụrụ mmadụ asaa e ji
eji, bụ ndị gụnyere ndị Izrel abụọ na ndị Taịland ise.
A hụrụ ka
ndị ojiegbe kpuchiri ihu duuru otu n’ime ndị Izrel ahụ e ji eji aha ya bụ Arbel
Yehud gafee igwe mmadụ juru ebe ahụ.
Netanyahu kọwara ọnọdụ ahụ dịka nke “na-atụ n’anya”.
Ụmụafọ
Taịland ndị a tọhapụrụ gụnyere Pongsak
Thaenna, Sathian Suwannakham, Watchara Sriaoun,
Bannawat Seathao na Surasak
Lamnao.
Mmadụ 20 anwụọla dịka ụgbọelu kpọkara na Saụt Sụdan
Ebe foto si, Reuters
Gọọmenti
ekwuola na ọ bụ naanị otu onye pụtara na ndụ oge ụgbọelu kpọkara na Saụt Sụdan
ma gbuo ndị ọrụ mmanụ iri abụọ (20) nọ n’ime ya.
Ụgbọelu ahụ
nọ n’ụzọ na-aga isi obodo mba ahụ bụ Juba kpọkara n’ime nkeji atọ o jiri malite
njem n’akụkụ ebe a na-amịpụta mmanụ agbịdị na Unity steeti.
Minista na-ahụ
maka mmanụ agbịdị na mba Saụt Sụdan bụ Puot Kang Chol kwuru na ọdachi ahụ
mere n’ụtụtụ Wenezde 29 Jenụwarị 2025.
Mmadụ ndị
ahụ nwụrụ anwụ gụnyere ụmụafọ Chaịna abụọ, otu onye Indịa na ndị Yuganda abụọ
ebe iri na ise (15) ndị ọzọ bụcha ndị Saụt Sụdan.
Ka ọ dị,
achọpụtabeghị ihe butere ọdachi ahụ mana ndị ọchịchị kwuru na ha ka na-eme nnyocha.
Mmadụ 18 anwụọla dịka ụgbọelu jeetị na helikọpta suru onwe ha n’Amerịka
Ebe foto si, Getty Images
Ụgbọelu mba
Amerịka na helikọpta ndịagha esuola onwe ha n’elu na Washington DC dịka ha
abụọ danyere n’osimiri Patomac River.
Ụgbọelu ahụ
si Wichita, Kansas bu ndị njem iri isii (60) na ndị ọrụ anọ ebe helikọpta ndịagha
Amerịka bu ndịagha atọ n’ime ya tupu njinji ahụ ejie.
Ndị ọrụ
gbatagbata ruru narị atọ (300) na-agbakọrọ ndị uweojii aka ugbua iji napụta
ndị danyere na mmiri.
Ndị uweojii
gwara ụlọmgbasaozi CBS na a dọpụtala ozu mmadụ iri na asatọ (18) mana ha a kpọghị
aha mmadụ ole merụrụ ahụ.
Dịka ụlọorụ
Federal Aviation Administration siri kwuo, ọdachi ahụ mere n’ọdọụgbọelu Reagan
Washington National Airport mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere itolu nke abalị n’ụbọchị
Wenezde 29 Jenụwarị 2025.
Onyeisiala
Amerịka bụ Donald Trump kwuru na e meela ka ọ mata gbasara “ihe mberede ọjọọ”
ahụ ma kelee ndị ọrụ gbatagbata maka “ọrụ pụrụiche” ha na-arụ.
Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi, Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa maara anyị mma ooo
Anyị abịala ọzọ taa ime ka ị mara ihe niile na-eme n'akụkụ ụwa dị iche iche.
Ọ bụ Adline Okere na Chinonso Ugorji nọ n'ọgbọ n'ụtụtụ a mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-emecha sonyere anyị.
Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.
Yukren atụọla ogbunigwe n’ụlọọrụ mmanụ mba Rọshịa nke ugboro abụọ n'otu izu
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Yukren atụọla ogbunigwe n’ụlọọrụ mmanụ mba Rọshịa nke ugboro abụọ n'otu izu
Mba Ukraine ekwuola na ndịagha ya ji droonu tụọ ogbunigwe n’ụlọọrụ na-eme mmanụ ọkụ n'obodo Kstovo nke Rọshịa, ihe dịka kilomita 800 site n'ahịrị ihu n’ọwụwa anyanwụ Ukraine.
Ụlọọrụ mgbasa ozi Ukraine kwuru na droonu anọ gbara ebe nchekwa mmanụ ọkụ nke ụlọọrụ Lukoil nke mere ka ụlọọrụ ahụ nwee nnukwu mmebi.
Ihe onyonyo e tinyere na soshịa midia gosiri ebe nnukwu ọkụ na-agba n’ụlọọrụ mmepụta ihe.
Gọvanọ mpaghara ahụ bụ Gleb Nikitin kwuru na irighiri ihe ndị dị n'droonu dara na mpaghara ụlọọrụ mmepụta ihe, mana o nweghị onye nwụrụ n’ebe ihe ahụ mere.
N’aka nke ọzọ, gọvanọ nke mpaghara Smolensk bụ Vasily Anokhin kwuru na Telegram na e nwere nnukwu mwakpo nke droonu megide "akụrụngwa ndị nkịtị" na mpaghara ya, n'agbanyeghị na o nweghị onye ọ bụla nwụrụ ozugbo.
Anokhin kwuru na agbaturu otu n'ime droonu ndị ahụ mgbe ọ na-achọ ịwatu ụlọọrụ ike nuklia mana BBC enwebeghị ike ịchọpụta ozi a n'onwe ya.
Chancellor Rachel Reeves akwadola ịrụ okporo nke atọ n’ọdụ ụgbọelu Heathrow dị na London iji kwalite uto akụnaụba nke mba UK.
O kwuru na mgbasawanye Heathrow nke a hapụrụ ọtụtụ afọ iri maka ihe gbasara gbururgburu ebe obibi, ga-eme ka mba Britain bụrụ ebe kacha mma ejikọrọ azụmahịa.
Reeves gwara ndị isi azụmahịa na ya kwadoro mgbasawanye ọdụ ụgbọelu Luton na Gatwick ya na mpaghara uto dị n’etiti Oxford na Cambridge nke o kwuru na ọ ga-abụ “Silicon Valley n’Europe”.
Onyendu Conservative bụ Kemi Badenoch kwuru na ọ bụ atụmatụ pati ya ka enwere, mana kwuo n’iwu ọhụrụ nke ndị ọrụ ga-emebi atụmanya uto ọ bụla.
Reeves ji okwu nwere tinye nchekwube na ntụkwasị obi n'ime akụnaụba mba UK, nke na-ahụ nsogbu n'ime ọnwa ndị na-adịbeghị anya dịka uto na-agbadata.
O kwughị n’ụzọ doro anya na ọ gaghị ewelite ụtụisi ọzọ n'oge opupu ihe ubi - mana ọ siri ọnwụ na gọọmentị amalitela imegharị ihe ma kpebisie ike ịga n'ihu ngwa ngwa' iji bulie uto.
Ọ kọwara mba UK dịka obodo nwere "nnukwu ikike" nke e jidere ogologo oge n'ihi na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị enweghị "obi ike" ịma ihe dị ugbu aka.
Onyeisiala DR Kongo ajụla mkparịtaụka udo maka nsogbu Goma
Ebe foto si, BBC/Getty
Onyeisiala
mba Democratic Republic of Congo bụ Félix Tshisekedi ekwuola na ya agaghị esoye
mkparịtaụka ehibere ịkwụsị mwakpo ndị nnupụisi n’obodo Goma dị n'ebe ọwụwa
anyanwụ dịka ụlọọrụ mgbasa ozi mba ahụ kwuru.
Onyeisiala
mba Kenya bụ William Ruto akpọla Tshisekedi na Onyeisiala mba Rwandan bụ Paul
Kagame nzukọ mpaghara ahụ maka ọgbaghara dị na Kongo dịka ozu mmadụ tọgbọrọ
n’okporoụzọ Goma ebe ọgụ na-aga n’ihu.
A na-ebuo
Rwanda ebubu na ọ na-akwado otu nnupụisi bụ M23 nke chọrọ ịkpachi obodo Goma.
Cheta na ndịagha
nnupụisi chọrọ ịkpachi obodo Goma dịka akụkọ kwuru ha enwerela ọdụ ụgbọelu.
Gọọmentị DR Kongo na-esi ọnwụ na ọ ka na-achị ebe ahụ dịka ọgụ na-aga n'ihu n’obodo ahụ. Ụlọọrụ
enyemaka kwuru na ezukpọla ihe dị n’ụlọ nkwakọba ihe nri na ọgwụ.
Dịka ụlọọrụ
UN siri kwuo, nsogbu dị n’etiti ndị nnupụisi M23 na ndịagha emela ka ọtụtụ ụlọọgwụ
were jupụta na ndị emerụrụ ahụ ya na ozu ịtọgbọrọ n’okporoụzọ.
Ihe ndị
nnupụisi mere emela ka ndị ngagharịiwe malite emebi ihe ụlọọrụ nnọchite anya
mba ofesi nọ n’isi obodo Kinshasa. A malitela ịkpọ oku maka mkparịtaụka udo ka
akwụsị ọgụ.
Anyị agaghị amachi azụmahịa, ọpụpụ na mbata ndị si na Mali, Niger na Bukina Faso - ECOWAS
Ebe foto si, ECOWAS
Nkọwa foto, Anyị agaghị amachi azụmahịa, ọpụpụ na mbata ndị si na Mali, Niger na Bukina Faso - ECOWAS
Otu Economic Community of West African States (ECOWAS) ekwuola na ya agaghị amachị azụmahịa na ọpụpụ na mbata ndị si na Mali, Niger na Bukina Fasọ dịka ọpụpụ mba atọ ahụ n’otu ECOWAS kụrụ ọnụ n’ụbọchị taa Wenezde 29 Jenụwarị 2025.
Otu a kwuru n’akwụkwọ ozi o wepụtara n’ụbọchị Wenezde 29 Jenụwarị 2025, na ya ga na-anabata paspọtụ na kaadị njirimara ụmụamaala nke mba atọ ahụ hibere otu a na-akpọ “Sehel bloc”.
ECOWAS kwuru na ọ ga-eji iwu ECOWAS Trade Librealization Scheme na nke itinye ego eso ngwa ahịa na ọrụ si na mba atọ a. O nyere ụmụamaala si na mba atọ a ikike ịbata na ịpụ mba ndị dị na ECOWAS na-ejighị akwụkwọ “visa”.
Otu ahụ kwuru na nhazi ndị a ga-adị ruo mgbe ndị isi obodo na gọọmentị ECOWAS ga-ekpebi ụzọ zuru ezu n’usoro ndị ECOWAS na mba atọ ahụ ga-esi emekọrịta ihe n'ọdịnihu.
Cheta na mba atọ bụ Mali, Niger na Bukina Fasọ ndịagha n’achị dịka ndị isiala, kwupụtara otu afọ garaaga na ha achọkwaghị iso n’otu ECOWAS ọzọ.
A kpụgaala nwaafọ Naịjirịa mba Amerịka n’ihi ebubo imetọ nwata iji napụta ya ego
Ebe foto si, Getty Images
A kpụgaala
nwaafọ Naịjirịa mba Amerịka maka ikpe ya ikpe gbasara ebubo imetọ nwata iji napụta
ya ego bụ nke butere ọnwụ nwata ahụ.
E fegara
Hassanbunhussein Abolore Lawal gbara afọ iri abụọ na anọ (24) ma bụrụ nwaafọ
Osun steeti mba Amerịka n’ụbọchị Satọde 25 Jenụwarị 2025 dịka a sị na Amerịka na gọọmenti
Naịjirịa nwere nkwekọrịta na agaghị ama ya ikpe ọnwụ ọ bụrụ ma a chọpụta na
aka ya dị n’ebubo ahụ.
Dịka ụlọmgbasaozi
Amerịka siri kwuo, Lawal pụtara n’ụlọikpe dị na Kolombịa, Saụt Karolina n’ụbọchị
Mọnde 27 Jenụwarị 2025 dịka o yi uwe ndị mkpọrọ na-acha oroma oroma tinyere ịga
a tụrụ ya n’aka nakwa n’ụkwụ.
O kwuru na
aka ya dị ọcha n’ebubo niile e boro ya nke gụnyere ịmetọ nwata ruo mgbe ọ nwụrụ
nakwa imepụta na ikesa onyonyoo mmetọ nwata.
A malitere
ime nnyocha mere e ji kpụgaa nwaamadị ahụ mba Amerịka oge Gavin Guffey gbara afọ
iri na asaa (17) gburu onwe ya oge Lawal metọchara ya.
E boro
ebubo na Lawal mere onwe ya ka nwaanyị na soshịal midịa ma manye nwata ahụ
na-eto eto izitere ya foto ndị ekwesịghị ekwesi.
A sị na ọ
napụrụ nwata ahụ ego ma zigaara ya ozi iyi egwu na ya ga-agba foto ndị ahụ n’anwụ
ma mebie aha ya ewezuga ma o ziteere ya ego.
E kwuru na Lawal
mechara meekwa ndị ezinaụlọ Guffey otu ụdịrị ihe ahụ.
Lawal nwere
ike ịga mkpọrọ mkpụrụ ọka mana ka o siladị ebubo imetọ nwata ruo mgbe ọ nwuru bụ
nke nwere ntaramaahụhụ mkpọrọ afọ iri atọ (30).