Gọvanọ Ebonyị
steeti akwụsịla ndị kọmishọna mmadụ iri abụọ na ise na mmadụ iri isii ndị ọzọ ọrụ
maka abịaghị mmemme gọọmenti na steeti ahụ.
Ozi ọnụ
na-ekwuru steeti ahụ bụ Monday Uzor wepụtara kwuru na Gọvanọ Francis Ogbonna
Nwifuru nyere iwu n’ụbọchị Mọnde na ndị ahụ ọ kwụsịrị ọrụ agaghị anata ụgwọ otu
ọnwa.
Uzor kwuru
na ndị ọzọ aka na-achị steeti ahụ kwụsịtụrụ ọrụ gụnyere ndị enyemaka pụrụ iche iri
abụọ na anọ na ndị odeakwụkwọ nke mịnịstrị mmadụ iri abụọ na abụọ.
Uzor kwukwara
na Gọvanọ nyere iwu na nkwụsịtụ ọrụ ahụ ga-amalite ozugbo ma kwuo na ndị ahụ ọ
kwụsịtụrụ ọrụ enweghi ikike ibinye aka n’akwụkwọ ọbụla n’ogologo oge ahụ.
Ọ gwakwara ndị
Kọmishọna o metụtara ka ha gaa n’ihu nyefee ọrụ ha n’aka ndị odeakwụkwọ nke mịnịstrị
ha.
Ụfọdụ ndị kọmishọna
o metụtara gụnyere “Stanley Lebechi Mbam, Leonard Uguru, Mathew Nwobashi, Nwogo
Obasi, Victor Chukwu, Jude Okpor, Ikeuwa Omebe, Chidi Onyia, Oguzo – Offia
Nwali, Ben. Uruchi Odo, Donatus Ilang, Ngozi Obichukwu, Moses Ekuma Ikenna,
Richard Idike, Felicia Nwankpuma na Chinedu Nkah.
Ndị ọzọ gụnyere
Ogbonna Obasi Abara, Nkechinyere Iyioku, Francis Ori, Tochukwu Okorie,
Valentine Okike Uzor, Sunday Inyima, Ogbonnaya Okorie, Elechi Elechi na Stanley
Ogbuewu.
Nnukwu ndị
enyemaka pụrụ iche gụnyere; “Bassey Chukwu, Rose Ofoke, Kerian Ofoke, Anthony
Nwegede, Onu Nwonye, Lilian Nwachkwu, Fred Nwogbaga, Paul Nwogha, Pius Nwoga,
Ali Ikechukwu, Nwiboko Chukwuma, Esther Nwogha, Caleb onwe na Chinedu Awo.
Ndị enyemaka
pụrụ iche ndị ọzọ gụnyere; “Mbam Emmanuel, Tobias Ogbonna, Easy Okike Uzo,
Obinna Oko Enyim, Chima Nnachi Okoro, Nwali Amechi, Sabinus Nwibo, Okorie
Jideofor, Sunday ogenyi, Stanley Kaman, Ikechukwu Jideofor, Emeka Okpa Onwe,
David Aja, na Frank Uka.
Ndị ọzọ bụ:
“John Nwangbo, Ogbonna Melford Nwifuru, Ifeanyi Ujebe, Chima Ogbuagu, Kizito
Nwenyi, Uwa Henry Ifeanyi, Elechi Okechukwu Solomon, Ibina John Ogbonna, Mbam
Ifeanyi na Nwigum Nonso Christian.
Ndị odeakwụkwọ
mịnịstrị gụnyere; “Lawrence Ezeogo, Isioma C Arunne-Inyang, Rose Ibe, Ogechi
Nwobasi, Anwu Theresa, Lynda Alo, Monday Nkwuda, Mary Ngozi Otozi, Martina
Obiya, Ogechi Anaso-Kalu, Emmanuel Onwe na Henry Nworie.
Ndị ọzọ bụkwa
“Joy Mbam, Henrietta Ikechukwu Oruh, Peter Ede, Gabriel Odo, Mfon Williamson, Alusi
Felicia, Betty Uzoma, Chukwuma Ojeogu, Ikechukwu Alobu na Fidelis Nwankwo.