Ụlọọrụ Nigerian
National Petroleum Company (NNPC) ekwuola na ụlọọrụ Port Harcourt Refining
Company dị na Port Harcourt, Rivas steeti amalitela imepụta mmanụ agbịdị.
Onyeisi
mgbasaozi NNPCL bụ Femi Soneye gbara ama n’akwụkwọ ozi o wepụtara.
Soneye
kwuru na ụlọọrụ mmanụ agbịdị ahụ ga na-emepụta barrel mmanụ agbidi dị narị puku
naịra isii (600,000) kwa ụbọchị.
Cheta na ụlọọrụ
na-emepụta mmanụ agbịdị ahụ mechiri kemgbe ọtụtụ afọ n’agbanyeghị nkwa ndị
isiala dị iche cihe kwere ime ka ọ malite ịrụ ọrụ.
Naịjirịa so
na mba kachasị emepụta mmanụ agbịdị n’Afrịka mana ọ ka na-enwe nnukwu ụkọ mmanụ
ụgbọala n’agbanyeghị na e nwere ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbịdị anọ na Naịjirịa.
Ozi a NNPCL
wepụtara kwuru na a ga-amalite ibuta ma kesaa mmanụ ụgbọala site n’ụlọọrụ Port
Harcourt Refining Company.
Ụlọọrụ Port
Harcourt Refining Company e mepere n’afọ 1965, bụ ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbịdị
kachasị na Naịjirịa. E mepere nke abụọ ya na 1989.
N’afọ 2019,
akụkọ kwuru na ego ruru otu narị ijeri naịra na iri isii na asaa (167 billion
naira) funarịrị Port Harcourt Refining Company maka ọ rụghị ọrụ ọtụtụ afọ.
Ọgbakọ
Nigeria Federal Executive Council nọrọ n’ọnwa Maachị 17, 2021 kwado ego ruru
otu ijeri dọla na ụma ise ($1.5billion) ka e jiri dozie ụlọọrụ Port Harcourt
Refining Company.
Oge ahụ,
onye bụbu mịnịsta nta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva kwuru na ndozie
ahụ ga-enwe nkeji atọ. Nke mbụ bụ ga-enwe ọnwa iri abụọ na asatọ (28), agba nke
abụọ ọnwa iri abụọ na anọ (24) ebe agba nke abụọ ga-enwe ọnwa iri anọ na anọ
(44).
N'aka nke ọzọ, Onyeisiala
Bola Tinubu etoola ma kelee onyeisi ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Company
Limited (NNPCL)bụ Mele Kyari maka mbụ ụlọọrụ ya gbara iji mee ka ụlọọrụ mmanụ
agbịdị Port Harcourt malitere ọrụ ọzọ.
Ozi ọnụ
na-ekwuru Onyeisiala bụ Bayo Onanuga wpụtara mere ka a mata na Onyeisiala Bola
Tinubu kelere onye bụbu onyeisiala bụ Muhammadu Buhari maka atụmatụ o wepụtara
iji mee ka ụlọọrụ mmanụ agbịdị Naịjirịa niile malite ịrụ ọrụ.
Ọ gara n’ihu
kelee ụlọakụ African Export-Import Bank maka ntụkwasịobi ha nwere nakwa ego ha
nyere iji mee ka nke a dị ire.
Onyeisiala
Bola Tinubu gara n’ihu gwa onyeisi ụlọọrụ NNPCL ka ọ gbaa mbụ ma mee ka ụlọọrụ
mmanụ agbịdị nke a bụọ dị na Port Hacourt, nke dị na Warri nakwa nke dị Kaduna malite
ọrụ ọzọ.