Ụlọakụ etiti
Naịjirịa (Central Bank of Nigeria, CBN) enweputara iwu ọhụrụ machịrị ndị na-eme
azụmahịa POS ịtụ mgbere ego karịrị otu nde na narị naịra abụọ (N1.2m) kwa ụbọchị.
CBN mere ka
a mata nke a n’ozi ọhụrụ ha weputara maka usoro ndị POS ga-eji na-atụ mgbere bụ
nke onyeisi na ngaraba CBN na-ahụ maka ịkwụ ụgwọ bụ Oladimeji Yisa Taiwo binyere
aka.
CBN kwuru na bido n’ọnwa Juli 2024, e nwere POS karịrị nde atọ na-arụ ọrụ, ebe e nwere POS
ruru nde anọ bụ nke e debenyere akara ha dịka ndeko Nigeria Interbank
Settlement System Plc si dị.
CBN kwukwara
na ndị mmadụ agaghị enwere ego karịrị narị puku ise (N500,000) n’otu izu ụka na
POS.
Ọzọ bụ na ụlọakụ
niile ga-eme ka ndị mmadụ hara iwere ego karịrị otu narị pupu naịra (N100,000)
kwa ụbọchị.
CBN kwuru na
ihe mere ha ji bido ụdịrị atụmatụ ahụ bụ ka ha mee ka akwụkwọ ego hara ịkarị ndị
mmadụ n’aka ma wetuo ọnụ ọgụgụ ego na-adịghị n’ụlọakụ.
Ukraine ịbanye NATO agwụla ihe ga-akwụsị agha dị n’etiti anyị na Russia - Zelensky
Ebe foto si, EPA
Onyeisiala
Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na ọ bụrụ na agha dị na mba ahụ ga-akwụsị,
ihe ọ pụtara bụ na mpaghara mba ahụ ọ na-elekọta ga-enwetarịrị ohere isonye n’otu
nchekwa NATO.
N’oge ụlọmgbasaozi
Sky News gbara ya ajụjụ were ogologo oge, Zelensky kwuru na ya ga-ekweta ịbanye
NATO naanị ma ọ bụrụ na otu ahụ ga-anabata mpaghara mba ahụ niile mbaụwa maara
dịka Yukren.
Ọ gbakwunyere
sị ọ bụrụ na Yukren nweta ohere ahụ, ha ga-amalite ịgbalị ka ha weghachite
mpaghara ndị ọzọ dị n’aka Rọshịa site n’usoro “mkparịtaụka”.
Mana ka o
sinadị, enwebeghị nkwa ọbụla NATO kwere Yukren.
Guinea na-achọ itinye iwu ga-egbochi ụmụaka ịbanye na soshal midịa
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọchịchị
Gini na-achọ imebe iwu ga-enye ha ohere ịhụ ihe na-eme na soshal midịa iji
gbochie obere ụmụaka ịhụ ihe ndị ekwesịghị ekwesị maka ha.
Praịm
Minista Gini bụ Amadou Oury-Bah nyere iwu ka Mịnịstrị nziritaozi na Mịnịstrị
na-ahụ maka ụlọorụ nziritaozi dị iche iche na mba ahụ nyochagharịa iwu ha iji
belata ihe obere ụmụaka nwere ike ịhụ n’ịntaneetị.
Oury-Bah
kwuru na iwu ọhụrụ ahụ ga-egbochi ụmụaka ịhụ ihe ndị ‘ekwesịghị ekwesị’ a na-efesa
n’ịntaneetị.
Ọ bụrụ ma a
nabata iwu a, ọ ga-abụ nke kachasị taa akpụ a na-etinye n’ogbe nziritaozi
soshal midịa n’Afrịka.
Ka o sinadị,
ndị nkatọ ahụtala mkpebi ahụ dịka atụmatụ gọọmenti igbochi ọhanaeze inweta ozi
dị iche iche n’ime mba a na-emekpa ndị mgbasaozi ahụ n’okpuru ọchịchị ndịagha.
Praịm Mịnịsta Canada ezutela Donald Trump maka atụmatụ ya ibuli tarifu
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Justin Trudeau na Donald Trump
Prịam mịnịsta
mba Canada bụ Justin Trudeau ezutela Donald Trump na Florida maka nkata banyere
atụmatụ ya ịmanye tarifu 25 pasenti na ngwa ahịa ọbụla si Canada abata Amerịka.
Cheta Donald
Trump nọrọ n’izuụka gara aga kwuo na ya ga-amanye 25 pasenti tarifu na ngwa ahị
ọbụla si Canada, China nakwa Mexico na-abata mba Amerịka ma e duo ya n’iyi
ọrụ dịka Onyeisiala na Jenwụwarị 2025.
Anyị
nwetara ozi na Trudeau na Trump kpara n’akwe nti n’izu ụka a tupu Trudeau gawa
Amerịka ma kwuo na Canada na Amerịka nwere ezi mmekọ oge Trump bụbu Onyeisiala.
Mana ugbua,
a na-ekwu na mmekọ dị n’etiti Trudeau na Trump adịghịzi etu ọ dị na mbụ.
Trudeau bụ Onyeisiala
mbụ nke otu G7 na-aga izute Trump dịka o merichara ntuliaka ọkwa Onyeisiala e
mere na Nọvemba 5, 2024 n’Amerịka.
Ndị omekome awakpola ma gbuo mmadụ abụọ n’obodo dị n’Abia
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị obodo Umuchima na-agbapụ n'obodo ha maka mwakpo ndị omekome
Ndị obodo Umuchima dị n’okpuru ọchịchị Ngwa Nọt, Abia steeti nọ n’ọgbaaghara
ugbua maka mwakpo ndị ji egbe a na-amaghị wakporo ha ma gbuo otu nwoke a kpọrọ
aha dịka Osama.
Akụkọ kwuru na ndị ahụ ji egbe boro Osama ebubo inye ndịagha akụkọ
banyere ha nke mere ka ndịagha wuchie n’obodo ahụ ma wakpo ọdọ ha n’izu ụka
gara aga.
Onye ọzọ ha gburu bụ otu onyeisi ndị nche a na-ekwughị aha.
Ọdachi a etinyela obodo ahụ n’oke ọgbaaghara nke mere ka ọtụtụ hapụ ụlọ
ma gbalaga.
Akụkụ kwuru na ndịagha wakporo ogige ndị omekome ahụ a na-enyo enyo na
ha bụ ndị otu Eastern Security Network (ESN) and Indigenous People of Biafra (Ipob)
dị n’obodo Umuchima ụbọchị Mọnde 25 Nọvemba, 2024. Ndị omekome ahụ na ndịagha kwatara
mgbọ nke mere ka ndị omekome ahụ gbaa ọsọ ma hapụ igwe ọgbatumtum na akụrụngwa
ha dị iche iche.
Ndị obodo Umuchima kwuru na ha na-atụegwu na ndị omekome ahụ ka nwereike
ịwakpo ha ọzọ n’ụzọ dị ukwuu. Ha kwuru na ndịagha apụla n’obodo ha gawa Isiala
Ngwa Saụt, Umuahia Saụt na Nọt ebe ụfọdụ gawara Aba na Rivas steeti.
Osita Chidoka ahapụla pati Peoples Democratic Party
Ebe foto si, Osita Chidoka/Facebook
Nkọwa foto, Osita Chidoka
Onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Osita Chidoka ahapụla pati
Peoples Democratic Party.
Chidoka gbara ama a na mparịtaụka ya na ụlọọrụ Channels Tv nwere.
O kwuru na ihe mere o jiri ewezuga ya na PDP nakwa ihe gbasara ndọrọndọrọ
ọchịchị bụ iji nwee ohere lebanye anya n’ụlọọrụ ya bụ Athena Centre for
Policy and Leadership.
O kwuru na o zigara onyeisioche PDP na wọdụ ya dị n’Obosi, Anambra
steeti akwụkwọ ozi arụkwaghịm ya.
Chidoka gara n’ihu kwuo na ya kwụrụ chịm ya na ụmụafọ Naịjirịa chọrọ
agamnihu Naịjirịa ịrụkọ ọrụ iji nweta mgbanwe n’etu e si eme ndọrọndọrọ ọchịchị
A NaỊjirịa.
Ụtụtụ ọma Igbo bụ Igbo
Ndewo maka isonyere anyị taa na BBC Igbo dịka anyị na-enwetara gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ.
Gaa n'ihu sonyere anyị n'akara soshal midia anyị maka akụkọ na ihe ndị ọzọ anyị na-enwetara gị taa.
Daalụ...
Ụlọikpe atọhapụla mmadụ 50 ndị uweojii kwuru bụ ndị IPOB
Ebe foto si, AFP
Ọkaikpe
Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu dị n’Abụja agọpụla ma tọhapụ opekatampe mmadụ iri ise
(50) e boro ebubo na ha bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB).
Mmadụ ndị ahụ
gụnyere ụmụnwaanyị anọ ka e boro ebubo dị iche iche gbanyere ụkwụ n’iyi ndụ
egwu.
Oge ọ
na-achabi ikpe ahụ, Omotosho kwuru na ndị uweojii Naịjirịa dara mba igosipụta
arụ mmadụ ndị ahụ mere.
Ọkaikpe ahụ
kachapụrụ ebubo atọ ndị uweojii boro mmadụ ndị ahụ n’ihi na enweghị ihe akaebe gosiri
na ha mere ihe e boro ha n’ebubo.
Akụkọ kwuru
na Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa kpụpụrụ mmadụ iri ise ahụ n’ụlọikpe site n’akwụkwọ
ọ gbara n’abalị 10 Jenụwarị.
Akwụkwọ ahụ
e wegara n’ụlọikpe n’abalị 9 Febụwarị boro ebubo na ndị uweojii Anambra steeti
nwụchiri mmadụ iri ise ahụ n’Umunze Uga dị n’Okpuru ọchịchị Aguata site n’ozi dị
mkpa ha nwetara.
Ha kwuru na
mmadụ iri ise ahụ bụ ndị a nwụchiri n’ime ụgbọala 911 akara ya bụ XA-139 BDN, bụ
ebe ha nọ na-enwe nzukọ gbasara iyi ndụ egwu n’abalị 12 Disemba 2023.
Chad akwụsịla mmekọ ha na ndịagha mba France
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala Chad Mahamat Idriss Deby na ndịagha
Gọọmenti
Chad ekwuola na ha akụsịla mmekọ ndịagha ha na mba France. Nke a na-abịa awa
olo na ole Mịnịsta mba France na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Jean-Noel Barrot
gachara Chad.
Mịnịsta mba
Chad na-ahụ mmekọ mba ofesi bụ Abderaman Kolamallah kwuputara nke a n’akwụkwọ
ozi o wepụtara ma kwuo na nkea abụghị ụdịrị nkwụsị ha kwụsịrị mmekọ ha na Niger
na ndị ọzọ.
Chad bụ mba
nwere ezi ngalaba na mmekọ ndịagha mba France n’Afrịka kemgbe ha wepụrụ ndị
agha ha na Mali, Burkina Faso na Niger.
Kolamallah
kwuru France bụ mba dị mkpa mana mba Chad eruola oge ha ga-anọrọ onwe ha ma mee
ihe dịrị ha dịka mba nwereonwe ya.
Mba Chad bụ
mba ikpeazụ dị na mpaghara sahel nabatara ndịagha France
Mahamat Idriss Deby bụ onyeisiala ha kemgbe afọ 2021 ka ndịagha gburu
nna ya bụ Idriss Deby Into onye nọrọ n’ọchịchị ruo afọ iri atọ (30).
Oge Idriss Deby Into nọ n’ọchịchị, ọ na-adabere na nkwado ndịagha France
maka ọgụ ọbụla dịka nke mere n’afọ 2008 na 2019.
Ụlọikpe ezigala onye ọrụ ụlọakụ n’ụlọnga maka mpụ ego n'Enugwu Steeti
Ebe foto si, Enugu State Police Command
Nkọwa foto, Mmadụ atọ a na-enyo enyo maka mpụ ego
Ndị uweoji Enugwu steeti ekwuola na ha akpụpụla nwaamadị Ifeanyi Nnamani ụlọikpe maka ebubo mpụ ego
e tinyere n’ụlọakụ ọ na-arụ ọrụ na ya.
Ifeanyi
Nnamani bụ onye na-arụ ọrụ n’ụlọakụ dị n’Enugwu steeti kemgbe afọ iri na asaa.
Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Charles Ndukwe, kwuru na a kpụpụrụ Ifeanyi Nnamani na na-arụ ọrụ n’ụlọakụ dị n’Enugwu steeti kemgbe afọ iri na asaa na mmadụ abụọ ọzọ aha ha bụ Ndulaka Okwudili na
Philip Ozogwu ụlọikpe maka ebubo ohi ego Mba John
Ndukwe bụ onye tinyere ego ya n’ụlọakụ ahụ.
Oge a gbara ha ajụjụ ọnụ, mmadụ atọ kwuru na ego ha zuru eruola nde naịra anọ (N4,000,000) ma kọwaa na ọ bụ akara ekwenti Mba John
Ndukwe furuefu ka ha siri nweta ikike na ihe ndị ọzọ ha rụọ mpụ ahụ..
Ndulaka
Okwudili kwuru Philip Ozogwu nyere ya aka gbanwere aha dị n'akara njirimara Mba John Ndukwe nke nyere ha ikike iwepụ ego ya nwaamadị ahụ dị n'ụlọakụ.
Ozi Ndukwe gara n'ihu kwuo na ụlọakụ ahụ kpọtụrụ ndị uweojii ngwa ngwa ha chọpụtara mpụ ahụ. Ndị uweojii nwuchiri ha ma kpụpụ ha ụlọikpe.
Mana ụlọikpe
magie dị n'Enugwu steeti nyere Philip Ozogwu mgbapụta ma nye iwu ka a kpọchie Ndulaka Okwudili na Ifeanyi Nnamani n'ụlọnga dịka ikpe ha na-aga n'ihu.
Onyeisiala Tinubu ekwela mba France nkwa ezi ọnọdụ azụmahịa na Naịjirịa
Ebe foto si, Dada Olusegun/Instagram
Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu na Onyeisiala France Emmanuel Macron
Onyeisiala Bola
Tinubu ekwela nkwa na Naịjirịa dị njikere ịwulite mmekọ dị n’etiti ha na mba ndị
ọzọ ebe ọ gbasara nchekwa nri, mmanụ, ihe si na-chi, agụmakwụkwọ na nchekwa.
Onyeisiala
Tinubu kwuputara nke a n’ọgbakọ ya na Onyeisiala mba France bụ Emmanuelo Macron
nwere na Palais des L’Élysée ụbọchị Tọzde Nọvemba 28, 2024.
O kwuru ngalaba
ọrụ ugbo Naịjirịa bụ nke nwere uru juru eju bara abara ma kpọọ oku ka ndị azụmahịa
na ndị ji ego achụ ego tinye ego na nglaba ahụ n’ihi na mba ọbụla na-enweghị
nri tọrọ atọ.
Ọ gara n’ihu
kwuputa na akụnaụba Naịjirịa na-eme ọfụma ma dị njikere maka mmekọ azụmahịa ọkachasị
ndị azụmahịa mba France.
Onyeisiala
Tinubu mere ka o doo anya na Naịjirịa na-atụ anya mmekọ ha na mba France iji chụọ
ndị na-eyi ọha ehwu ọsọ ụkwụ eruala na Naịjirịa.
N’nzaghachi,
Onyeisiala Emmanuel Macron kelere Onyeisiala Tinubu maka njem ọ bịara na France
ma kwuo na ọ dịmkpa ka mba na mba nwee mmekọ iji buo agha megide ajọ ọnọdụ
nchekwa na ihe ndị ọzọ na-echere mba dị icheiche aka mgba.
Ụtụtụ ọma Igbo ndị ọma
Dịka ị na-esonyere BBC Igbo taa, anyị na-agọ ọfọ ka ihu ọma kpọọ gị taa.
Gaa n'ihu sonyere anyị n'akara soshal midia anyị maka akụkọ na ihe ndị ọzọ anyị na-enwetara gị taa.
Ndewo...
A rụpụtala ọgwụ ọhụrụ e ji agwọ ọrịa nchinume
Ebe foto si, PA
Ndị na-eme nchọpụta ekwuola na ha arụpụtara ọgwụ ọhụrụ
e ji agwọ ọrịa nchinume nke ndí bekee na-akpọ 'asthma'.
Nke a bụ ọgwụ mbụ a na-arụpụta ọhụrụ gbasara ọrịa nchinume kemgbe afọ iri ise garaaga.
Ndị ọrụ nchọpụta
na King’s College dị na London kwuru na ọgwụ
ọhụrụ ahụ nwetara nnukwu “mgbanwe” maka ahuike na ịgwọ ọrịa asthma.
Ọkammụta Mona Bafadhel kwuru na “ugbu a anyị ga-enye
onye na-arịa ọrịa nchinume ọgwụ dịka ọnọdụ ya si di”.
Ndị e jiri ọgwụ ọhụrụ ahụ gwọọ ọrịa nwereike ha ahara ịga
ụlọọgwụ ọzọ, ma ọ bụ nwee ọnọdụ ha ga-eji daa n’ọrịa ahụ ọzọ ma ọ bụ nwụọ maka ya.
Ọ kwuru na mmadụ ruru nde abụọ na-ada n’ọrịa nchinume kwa afọ.
Alison Spooner na-arịa ọrịa nchinume kemgbe afọ iri isi na ise (55years) kwuru na ya “hụrụ ihe mgbanwe” kemgbe a gbara ya ọgwụ ọhụrụ ahụ ma kọwaa ya dịka “ọrụ ebube”.
Mana n’afọ 2025 ka a ga-atule na a ga-enye igwe mmadụ ọgwụ ahụ.
Dọkịnta Sanjay Ramakrishnan nke mahadum Oxford kwuru na kemgbe narị afọ iri abụọ garaaga (20th century) ka a kwụsịrị ịrụpụta ọgwụ ọhụrụ gbasara ọrịa nchinume bụ ike kpatara ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ.
Dọkịnta Samantha Walker si na ụlọọrụ Asthma+Lung Uk kọwara ọgwụ ahụ dịka “ozi ọma” ọkọchasị ka ọ siri nyere ndị nwere ọrịa asthma kemgbe afọ iri ise aka n’ọnọdụ ahụike ha.
Onye a họpụtara dịka Onyeisi WHO n’Afrịka anwụọla
Ebe foto si, WHO African Region/X, Getty
Onye
na-abata ọhụrụ dịka Onyeisi ụlọorụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization
(WHO) n’Afrịka bụ Dr Faustine Ndugulile anwụọla.
Ndugulile bụ
nwaafọ Tanzanịa nwụrụ dịka ọ gachara ọnwa atọ a họpụtara ya dịka Onyeisi WHO n’Afrịka.
Nwaamadị ahụ
gbara afọ iri ise na ise (55) ma bụrụkwa onye Ọkaiwu na Dọkịta nwụrụ n’ụtụtụ Wenezde
27 Nọvemba 2024 dịka ọ na-anara ọgwụgwọ n’Indịa.
A maara ya
nke ọma maka agha o busoro Onyeisiala John Magufuli oge ọrịa Covid na-akpa
mkpamkpa n’afọ 2020, bụ oge ọ rụrụ ọrụ dịka osote minista ahụike.
A họpụtara
ya dịka onyeisi WHO n’Afrịka n’ọnwa Ọgọst ka ọ nọchie anya Dr Matshidiso Moeti
nke mba Boswana bụ onye nọrọ n’ọkwa ahụ ugboro abụọ.
Gọvanọ Ebonyi steeti achụọla kọmishọna abụọ n’ọrụ
Ebe foto si, Ebonyi state government house
Nkọwa foto, Gọvanọ Francis Nwifuru
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru achụọla otu komishiọna n’ọrụ ma kwụsịtụ Kọmịshọna ọzọ ọrụ maka ebubo imetọ ụlọọrụ ha dị icheiche.
Kọmishọna ahụ gọvanọ Nwifuru churu n’ọrụ bụ Francis Ori na-ahụ maka mmepe obodo na ụlọ obibi.
Onye nke ọzọ ka ọ kwụsịtụrụ ọrụ ihe ruru ọnwa atọ bụ dọkịnta Moses Ekuma bụ kọmishọna ahụike nke steeti ahụ.
Kọmishọna na ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ Jude Okpor mere ka a mata nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.
N’ozi ya “Gọvanọ Nwifuru achụọla kọmishọna na ahụ maka mmepe obodo na ịrụ ụlọ obibi bụ Francis Ori n’ọrụ’
“Ọ gwakwara kọmishọna na-ahụ maka ahuike bụ Moses Ekuma ka ọ hapụ ụlọọrụ ya kwụsitụ ọrụ ọnwa atọ.
Ndị ọzọ gọvanọ kwụsịtụrụ ọrụ ọnwa atọ gunyere ode akwụkwọ mịnịstịrị na-ahụ maka ahụike na ode akwụkwọ ngalaba na-ahụ maka ahụike n’ime obodo.
Cheta n’oge garaaga ka Gọvanọ Nwifuru chụrụ kọmishọna na-ahụ maka mmiri bụ Chinedum Nkah n’ọrụ maka ebubo adịghị arụọrụ ya n’usoro.
“Anyị ga-azụta ụgbọelu ọhụrụ anọ maka Enugu Air” – Gọvanọ Peter Mbah
Ebe foto si, Peter Mbah, Aircraft/X, Getty Images
Aka na-achị
Enugwu steeti bụ Peter Mbah kwuputara atụmatụ mkpata na mmefu ego afọ 2025 n’ụlọ
omeiwu steeti ahụ.
Atụmatụ
mkpata na mmefu ego ahụ bụ nke ọnụego ya dị narị ijeri naịra itoli na iri asaa
na otu (971bn).
Ọ kọwara na
ijeri naịra anọ na otu na ụma (41.132bn) ga-abụ maka iji zụta ụgbọelu ọhụrụ anọ
maka ụlọorụ njem ụgbọelu Enugu Air.
Ọ gara n’ihu
kwuo na gọọmenti Enugwu ga-agbakọọrọ ngalaba ndị nkịtị aka iji zụta ụgbọala
taxi ndị ọhụrụ ga-enye aka maka ime njem n’obodo ndị mepere emepe.
N’ụbọchị
Tuzde 26 Nọvemba 2024 ka Gọvanọ Peter Mbah
kwuputara atụmatụ mkpata na mmefu ego ahụ n’ihu ụlọ omeiwu Enugwu steeti.
Mba Israel na Hezbollah enweela nkwekọrịta ịkwụsị agha ma kweta usoro udo
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Nwanyị na-ebe akwa
Mba Israel na ndị omekome Hezbollah ekwetala ịkwụsị
agha ha na-anụ kemgbe ihe ruru otu afọ ugbua ma nwee nkwekọrịta ka udo ga-esi
bata na mpaghara ahụ.
Amụma udo ahụ n’etiti Israel na Hezbollah bidoro ịdị ire
n’awa ndị Lebanon nke 04:00 (02:00 GMT) n’ụbọchị Tuzde.
Agha ahụ bidoro
ihe karịrị otu afọ ugbua bịara kawanye njọ n’ọnwa Seputemba afọ a mgbe Israel
nwakporo mpaghara Lebanon, zịga ndị agha ma nwere ogbunigwe mebie ọtụtụ ihe.
Dịka nkwekọrịta ahụ sị dị, mba Israel ga-eji abalị 60
nwere nwepu ndị agha ha na lebanon.
Ebe foto si, Getty Images
Ha kwadoro ka ndị agha Lebanon nweghara ọnọdụ nchekwa ma sepu ndị Hezbollah aka n’ọrụ nchekwa na mpaghara ahụ.
Mba Amerika na France ga-ejiko aka ọnụ na-enyocha ihe niile Israel na Hezbollah kwekọrịtala.
Ma Israel ma Hezbollah na-ebo onwe ha ebubo sị na ọ bụ onye nke ọzọ dara ịwụ ma mebie nkwekọrịta ha nwere n’ego garaaga bụ nke mere ha jiri bido agha ọzọ.
Ihe China kwuru maka ụtụisi Donald Trump chọrọ ịmanye n'ahịa
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala mba China Xi Jinping na Donald Trump
Onye meriri
ntuliaka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald trump ekwuola na ọ ga-entinye ụgwọ
tarifu dị pasenti iri abụọ na ise (25%) na ngwa ahịa ọbụla si mba Canada na
Mexico abata mba Amerịka ụbọchị mbụ ya n’ọkwa dịka Onyeisial.
O kwuru na ọ
ga-etinyekwa tarifu dị pasenti iri (10%) na ngwa ahịa si mba China n’agbanyeghị
na enweela tariff dị na ya ugbua.
Tarifu bụ ụtụ
isi a na-akwụ n'ahịa ka ha na-abanye na mba ọbụla. Ụlọọrụ na-ebubata ngwa ahịa
ahụ bụ ndị na-akwụ ụtụ isi, ọ bụghị ụlọọrụ mba ọzọ na-ebupụ ha.
Trump kwuru
na tarifu ahụ bụ nzaghachi maka mpụ, arụ na ọgwụ ike na-esi n’okeala ndịda na
ugwu abata mba Amerịka.
China kọwara
tarifu ahụ dịka ihe na-enweghị isi ma kwuo na enweghị mba ọbụla ga-emeri ha n’ọgụ
azụmahịa.
Oneyisi
Ontario bụ mpaghara kachasị nwee mmadụ bụ Doug Ford, kwuru na tarifu pasenti
iri abụọ na ise (25%) ga-emetụta ndị ọrụ nakwa ọrụ ebeonyeisi ụlọomeiwu Sineti
Mexico gwara mba Amerịka ka ha kwụsị ịṅụ ọgwụ.
N'aka nke ọzọ, Onyeisiala
Mexico Claudia Sheinbaum gwara Donald Trump na tarifu ahụ ọ chọrọ imanye agaghị
egbochi ndị na-abata mba Amerịka nakwa ndị na-ebubata na ndị na-aṅụ ọgwụ n’Amerịka.
Onyeisiala Sheinbaum kwuru na ọ bụrụ na Trump
gaa n’ihu manye tarifu ahụ, mba Mexico ga-amanye tarifu na ngwa ahịa ọbụla si
Amerịka abata Mexico.
Yahaya Bello enyefeela onwe ya n’aka EFCC
Aka chịburu
Kogi steeti bụ Yahaya Bello azaala oku ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka
ego na Naịjirịa bụ EFCC kpọrọ ya n’ihi ebubo mmefu ego.
Ozi anyị nwetara
kwuru na ọ bụ Yahaya Bello na ndị Ọkaiwu ya sooro gaa n’ụlọọrụ EFCC n’ụbọchị
Tuzde 26 Nọvemba 2024.
N’ụbọchị
ikpeazụ e lebara anya n’okwu ahụ n’ụlọikpe, EFCC kpọrọ oku ka e yigharịa ikpe ya
ruo n’ụbọchị Wenezde 27 Nọvemba 2024.
Ụlọọrụ mmanụ agbịdị Port Harcourt amalitela ọrụ
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Foto ụlọọrụ mmanụ agbịdị Port Harcourt
Ụlọọrụ Nigerian
National Petroleum Company (NNPC) ekwuola na ụlọọrụ Port Harcourt Refining
Company dị na Port Harcourt, Rivas steeti amalitela imepụta mmanụ agbịdị.
Onyeisi
mgbasaozi NNPCL bụ Femi Soneye gbara ama n’akwụkwọ ozi o wepụtara.
Soneye
kwuru na ụlọọrụ mmanụ agbịdị ahụ ga na-emepụta barrel mmanụ agbidi dị narị puku
naịra isii (600,000) kwa ụbọchị.
Cheta na ụlọọrụ
na-emepụta mmanụ agbịdị ahụ mechiri kemgbe ọtụtụ afọ n’agbanyeghị nkwa ndị
isiala dị iche cihe kwere ime ka ọ malite ịrụ ọrụ.
Naịjirịa so
na mba kachasị emepụta mmanụ agbịdị n’Afrịka mana ọ ka na-enwe nnukwu ụkọ mmanụ
ụgbọala n’agbanyeghị na e nwere ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbịdị anọ na Naịjirịa.
Ozi a NNPCL
wepụtara kwuru na a ga-amalite ibuta ma kesaa mmanụ ụgbọala site n’ụlọọrụ Port
Harcourt Refining Company.
Ụlọọrụ Port
Harcourt Refining Company e mepere n’afọ 1965, bụ ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbịdị
kachasị na Naịjirịa. E mepere nke abụọ ya na 1989.
N’afọ 2019,
akụkọ kwuru na ego ruru otu narị ijeri naịra na iri isii na asaa (167 billion
naira) funarịrị Port Harcourt Refining Company maka ọ rụghị ọrụ ọtụtụ afọ.
Ọgbakọ
Nigeria Federal Executive Council nọrọ n’ọnwa Maachị 17, 2021 kwado ego ruru
otu ijeri dọla na ụma ise ($1.5billion) ka e jiri dozie ụlọọrụ Port Harcourt
Refining Company.
Oge ahụ,
onye bụbu mịnịsta nta na-ahụ maka mmanụ agbidi bụ Timipre Sylva kwuru na ndozie
ahụ ga-enwe nkeji atọ. Nke mbụ bụ ga-enwe ọnwa iri abụọ na asatọ (28), agba nke
abụọ ọnwa iri abụọ na anọ (24) ebe agba nke abụọ ga-enwe ọnwa iri anọ na anọ
(44).
N'aka nke ọzọ, Onyeisiala
Bola Tinubu etoola ma kelee onyeisi ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Company
Limited (NNPCL)bụ Mele Kyari maka mbụ ụlọọrụ ya gbara iji mee ka ụlọọrụ mmanụ
agbịdị Port Harcourt malitere ọrụ ọzọ.
Ozi ọnụ
na-ekwuru Onyeisiala bụ Bayo Onanuga wpụtara mere ka a mata na Onyeisiala Bola
Tinubu kelere onye bụbu onyeisiala bụ Muhammadu Buhari maka atụmatụ o wepụtara
iji mee ka ụlọọrụ mmanụ agbịdị Naịjirịa niile malite ịrụ ọrụ.
Ọ gara n’ihu
kelee ụlọakụ African Export-Import Bank maka ntụkwasịobi ha nwere nakwa ego ha
nyere iji mee ka nke a dị ire.
Onyeisiala
Bola Tinubu gara n’ihu gwa onyeisi ụlọọrụ NNPCL ka ọ gbaa mbụ ma mee ka ụlọọrụ
mmanụ agbịdị nke a bụọ dị na Port Hacourt, nke dị na Warri nakwa nke dị Kaduna malite
ọrụ ọzọ.