Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala aha mmadụ iri atọ na abụọ ọzọ
bụ ndị ga-anọchiteanya Naịjirịa n amba dị iche iche n’ụwa a kpọrọ ‘Ambassadors’
na Bekee.
N’akwụkwọ ozi abụọ dị iche iche o degaara Onyeisi ụlọomeiwu
na Naịjirịa bụ Godswill Akpabio, Tinubu gwara ha ga-enyochaa ma tinye aka
nkwado n’inye ndị a ọkwa na-egbughi oge.
Aha ndị e wepụtara n’ogogo ndị nnọchiteanya a kpọrọ ‘career
ambassadors’ dị mmadụ iri na ise gụnyere; Enebechi Monica Okwuchukwu (Abia),
Yakubu Nyaku Danladi (Taraba), Miamuna Ibrahim Besto (Adamawa), Musa Musa
Abubakar (Kebbi), Syndoph Paebi Endoni (Bayelsa), Chima Geoffrey Lioma David
(Ebonyi) and Mopelola Adeola-Ibrahim (Ogun).
Ndị ọzọ bụ Abimbola
Samuel Reuben (Ondo), Yvonne Ehinosen Odumah (Edo), Hamza Mohammed Salau
(Niger), Ambassador Shehu Barde (Katsina), Ambassador Ahmed Mohammed Monguno
(Borno), Ambassador Muhammad Saidu Dahiru (Kaduna), Ambassador Olatunji Ahmed
Sulu Gambari (Kawara) and Ambassador Wahab Adekola Akande (Osun).
Ndị aha ha dị n’ogogo ‘non-career ambassador’ gụnyere; Barrister Ogbonnaya Kalu si Abia, Reno Omokri
bụbu onye enyemaka onyeisiala (Delta), Mahmud Yakubu bụbu onyeisi ụlọọrụ Inec,
Onye bụbu nwunye Gọvanọ Ekiti Steeti bụ Erelu Angela Adebayo na Ifeanyi
Ugwuanyi bụbu Gọvanọ Enugwu Steeti.
Ndị ọzọ bụ Tasiu
Musa Maigari bụbu onyeisi ụlọomeiwu nke Katsina Steeti, Yakubu N. Gambo bụbu Kọmishọna
na Plateau Steeti, Ọkammụta Nora Ladi Daduut, Otunba Femi Pedro, Femi
Fani-Kayode bụbu mịnịsta njem ụgbọelu si Osun Steeti na Ọkaiwu Nkechi Linda
Ufochukwu si Anambra Steeti.
Aha ndị ọzọ sokwa n’akwụkwọ a bụ Fatima Florence Ajimobi
bụbu nwunye Gọvanọ Oyo Steeti, Lola Akande bụbu Kọmishọna Legọs Steeti, Grace
Bent bụbu Sịnetọ n’Adamawa Steeti, Victor Okezie Ikpeazu bụbu Gọvanọ Abia
Steeti, Sịnetọ Jimoh Ibrahim nke Ondo Steeti na Paul Oga Adikwu si Benue Steeti.
A na-atụ anya na ndị a Tinubu họpụtara ga-anọchiteanya Naịjirịa
na mba ndị ha nwere ezi mmekọrịta dịka Chaịna, India, Saụt Korea, Kanada, Meziko,
United Arab Emirates, Qatar, Saụt Afrịka, Kenya, nakwa otu ndị dịka United
Nations, UNESCO na African Union.
Ha ga-amata mba ebe a ga-eziga ha ma ọ bụrụ na ndị ụlọomeiwu
Sịnetị kwadoo nhọpụta ha.
Ha ndị mbụ Onyeisiala Tinubu zigaara n’izuụka gara aga gụnyere
Ayodele Oke (Oyo), Amin Mohammed Dalhatu (Jigawa) na Lateef Kayode Are (Ogun) bụ
ga-anọchiteanya Naịjirịa na mba Briten, Amerịka na Fransị ma ọ bụrụ a kwadoo
ha.
Tinubu kwuru na aha ndị ọzọ ka na-abịa.