Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya na-ewesara
Onyeisiala mba Rọshịa Vladimir Putin iwe dịka ọ gara izu ole na ole ọ gbasiri mbọ
ike ịkparịtaụka nkwụsị ọgụ na Yukren.
Mgbe ndị ụlọọrụ mgbasa ozi NBC News gbara ya ajụjụ ọnụ, Onyeisiala
Trump katọrọ Onyeisiala Putin maka ịkatọọ ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere na Onyeisiala
Yukren bụ Volodymyr Zelensky.
Onyeisiala Trump kwuru na ọ ga-etinye tarifu 50% na mba ndị
na-azụ mmanụ Rọshịa ma ọ bụrụ na o kwenyeghị na nkwụsị ọgụ.
N’izu gara aga, Putin tụrụ aro ka enwe gọọmentị UN na-achị
na Yukren ma hazie ntuliaka ọhụrụ wee malite mkparịtaụka udo.
Okwu Onyeisiala Trump gosipụtara mgbanwe ụda n'ebe Putin nọọ.
N'ime izu isii gara aga, Trump kparịrị Onyeisiala Zelensky
n'ihu ọha ma kwuo na ọ chọrọ ọtụtụ ohere n’aka onyeisiala Yukren.
N'aka nke ọzọ, ọ jara Putin mma ma kwenye n'ụzọ dị ukwuu
n'ihe onyeisiala Rọshịa chọrọ.
Ndị ọchịchị Yurop nwere nchegbu na Trump na-enwe mmasị na
Putin.
Mana okwu Trump kwuru na Sọnde gosiri mgbenwe. Ọ bụ nke mbụ Amerịka
na-eyi Rọshịa egwu maka ịdọrọ ụkwụ ya na mkparịtaụka nkwụsị ọgụ.
Cheta na Onyeisiala Trump katọrọ Onyeisiala Yukren, kpọọ ya
onye ọchịchị aka ike ma kwuo na ọ chọrọ ka Zelensky hazie ntuliaka na Yukren.
Dịka trump na-ekwu maka Putin na Zelensky, mba Rọshịa gara n’ihu
iwakpo Yukren. Ha wakporo Kharkiv – obodo ahụ bụ nke abụọ kachasị na Yukren.
Ndị ọrụ Yukren kwuru na mmadụ abụọ merụrụ ahụ ebe ụlọ ndị
mmadụ mebisiri.