Ndị gọvanọ mpaghara ala Igbo ezigaraala ndị ha na-achị ozi ekele maka
iwezuga onwe ha na ngagharịiwe ụmụafọ Naịjirịa na-eme ugbua n'ihi ọchịchị ọjọọ,
agụụ na ihe isiike.
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma kelere ndị Igbo maka iwezuga
onwe ha na ngagharịiwe ndị Naịjirịa na-eme ugbua.
Nke ahụ dị n'ozi ọ bipụtara n'akara ọbaozi X ya.
O kwuru na ọ bụ ihe na-agbawa obi na ndị ahụ butere ihe isiike dị ugbua
na Naịjirịa bụ ha na-akwado ngagharịiwe karịa ịgbakọọrọ gọọmenti aka maka ụzọ a
ga-esi gboo nsogbu ndị ahụ.
Dịka Uzodimma siri kwuo, Onyeisiala Bola Tinubu "egosila obi ebere
na mkpebi izute nsogbu ndị ahụ niile."
N'otu aka ahụ, aka na-achị Enugwu steeti bụ Peter Mbah egosila obiụtọ na
ndị Igbo esonyeghị na ngagharịiwe a na-eme ugbua na Naịjirịa.
Mbah kwụpụtara nke a n'ozi ọ bipụtara n'akara ọbaozi X ya n'ụbọchị Sọnde
4 Ọgọst 2024.
Mbah kwuru na site n'inwe ụdị mkpebi dị etu ahụ ahụ, ndị Igbo egbochiela
mbibi ndụ, azụmahịa na akụnaụba ma gosikwa ezi ntụkwasịobi n'ọchịchị Onyeisiala
Bola Tinubu.
Ọ sịrị na "enweghị ihe ga-eme ka ndị Igbo mee ngagharịiwe n'ihi na
enyela mpaghara ahụ ọkwa ọchịchị ndị gbara ọkpụrụkpụ na Gọọmenti Etiti."
N'ọzọ yiri nke ahụ, aka na-achị Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru etoola ụmụafọ
steeti ahụ tụmadị ndị ntorobịa maka ịṅa ntị n'okwu ndụmọdụ ma jụ isonye na
ngagharịiwe na-aga n'ihu ugbua gburugburu Naịjirịa.
N'ozi sitere n'aka kọmịshọna mgbasaozi Ebonyi steeti bụ Jude Okpor, gọvanọ
Nwifuru kelere ndị ntorobịa steeti ahụ maka igosi akparamaagwa ndị hụrụ obodo
ha n'anya ma kwe nkwa ịga n'ihu n'atụmatụ ndị ga-akwalite ọdịmma ha.
Ọ gwara ndị steeti ahụ ka ha gaa n'ihu na-echekwa udo na ịdịnootu nke Naịjirịa
ma na-egosikwa Onyeisiala Bola Tinubu ezi ndọnyeukwu.
N'ọzọ dị ka ibe ya, Gọvanọ Alex Otti nke Abia steeti ebunyela ndị steeti
ahụ abọ ekele maka iwezuga onwe ha na ngagharịiwe ndị Naịjirịa na-eme ugbua
n'ihi agụụ na ihe isiike.
Otti kwupụtara nke a n'ụbọchị Satọde 3 Ọgọst 2024 oge ọ na-efe ofufe n'ụlọụka
Seventh Day Adventist Church dị n'Aba.
Ọ sịrị na e nwere ụkpụrụ ndị ọzọ a pụrụ isi mee mkpesa n'ihi agụụ na ihe
isiike jupụtara Naịjirịa na-abụghị ụzọ ọgbaaghara.
Otti kwuru na ọ bụ eziokwu na ihe siri ike na Naịjirịa ugbua mana ụta adịghị
mma ịta mmadụ abụọ n'otu mgbe.