Etu ndị mmadụ si kwanyere Popu Francis ugwu ikpeazụ
Ọtụtụ ndị isiala mba dị iche iche nakwa ndị na-eru uju si mba dị iche iche gbakọrọ n'ogige St Peter's Square ụbọchị Satọde 26 Eprel, 2025 iji kwanyere Popu Francis ugwu ikpeazụ.
You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ maka olili ozu Popu Francis
Ọtụtụ ndị isiala mba dị iche iche nakwa ndị na-eru uju si mba dị iche iche gbakọrọ n'ogige St Peter's Square ụbọchị Satọde 26 Eprel, 2025 iji kwanyere Popu Francis ugwu ikpeazụ.
Ugbua a e liri ozu Popu Francis, ụfọdụ ndị isiala na ndị ọzọ gbakọrọ ịkwanyere ugwu ikpeazụ amlitela ịlaghachi be ha dị iche iche ebe ụfọdụ ndị ọzọ na-eru uju onwu Popu ka nọ na Rome.
Ajụjụ juru ọtụtụ mmadụ ọnụ bụ “Gịnị ga-eme ugbua e liri ozu Popu Francis”?
Dịka iwu Ụka Katọlik siri kwu, taa bụ Satọde 26 Eprel, 2025 bụ ụbọchị mmalite iru uju abalị itoolu nke ha kpọrọ Novemdiales. A ga-enwe ụka mass gwa ụbọchị n’ime abalị itoolu a iji cheta Popu Francis.
Ebe uche ndị Ụka Katọlik dị ugbua bụ ọgbakọ Conclave ndị Kadịnal ji ahọpụta Popu ọhụrụ
Ka ọ dị ugbua, otu Kadịnal ekwubeghị oge ọgbakọ a ga-abụ mana a na-ekwu na ọgbakọ na-abịa n’ime abalị iri na ise ruo abalị iri abụọ Popu ọbụla nwụrụ. Ihe nke a pụtara bụ na a na-atụ anya na ọ ga-abụ Tuzde 6 Mee, 2025.
Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky ekwuola na nzụkọ ya na Onyeisiala Turmp mba Amerịka taa na Vatịkan oge olili ozu Popu Francis bụ nke nwereike ịmịta mkpụrụ ma ọ bụrụ na ha jikọọ aka rụọ ọrụ.
N’okwu ya ngwa ngwa ụka olili ozu Popu Francis bịara na njedebe, Zelensky kwuru na ọ na-atụ anya na ihe niile ha kpara maka ya ga-amịta mkpụrụ. Ihe ndị ahụ gụnyere nchekwa ndị be anyị, ịkwụsị ịkwa mgbọ, inweta udo nakwa igbochi agha ọzọ.
O kelere Onyeisiala Trump maka ohere izute ya nakwa mbọ ọ na-agba inweta udo na Yukren.
E burula ozu Popu Francis gawa Santa Maria Maggiore ebe a ga-eli ya dị ụka olili ozu ya bịara na njedebe n'ogige St Peter's Square.
A ga-eburu ozu ya si ụzọ Central Rome, Piazza Venezia, Colosseum tupu o ruo Santa Maria Maggiore.
Olili ozu Popu Francis n'ime ụlọụka Santa Maria Maggiore, bụ nke agaghị egosi ohanaeze n'agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ jupụtara n'ihu ụlọụka ahụ.
Onyeisiala Amerịka Donald Trump na onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky ga-enwe ọgbakọ ọzọ taa.
Otu onye na-ekwuru gọọmenti Yukren mere ka a mata nke a.
Cheta na obi ọchịchị White House kwuru na Trump na Zelensky zutere na St Peter's Basilica tupu emume olili ozu Popu Francis amalite.
Ọgbakọ ha ahụ nwere naanị nkeji iri na ise (15), bụ nke ha kwuru na ọ mịtara ezi mkpụrụ.
Olili ozu Popu Francis nwụrụ ụbọchị Easter Mọnde 21 Eprel, 2025 na-aga n'ihu ugbua n'ogige St Peter's Square, Vatịkan.
N'ozi ọma ya, Kadịnal Giovanni Battista Re kwuru na Popu Francis bụ onye kwenyere na udo na ịhụnanya.
Ọtụtụ ndị isiala bịara olili ozu Popu Francis gụnyere Onyeisiala Donald Trump Amerịka, Onyeisiala Volodymyr Zelensky mba Yukren, Nwa eze William mba Ingland nakwa ndị ọzọ.
Onyeisiala Trump na Zelensky zutere n'ime St Peter's Basilica tupu emume olili ozu a amalite.
Obi ọchịchị Amerịka White House kpọrọ nzute ha abụọ dịka nke mịtara ezi mkpụrụ.
Ihe karịrị mmadụ 200,000 na-eru uju bịara ịkwanyere Popu Francis ugwu ikpeazụ tupu e lie ya.
Ihe ruru mmadụ narị puku anọ na iri anọ (140,000) agbakọọla n’ogige St Peter’s Square nakwa okporoụzọ gbara ya gburugburu maka olili ozu Popu Francis.
Ozi si n’aka ndị uweojii Itali kwuru na ndị gụnyere mmadụ puku iri anọ nọ n’ime St Peter’s Square.
Ọ bụ Kadịnal Giovanni Battista Re bụ onyeisi otu ndị Kadinal ga-anọ n'isi ikpe ụka olili ozu Popu Francis.
Kadịnal Giovanni Battista gbara afọ 91 bụ si mba Itali. A họpụtara dịka ụkọchukwu n'afọ 1957.
N'afọ 2001, Popu John Paul II họpụtara ya dịka Kadịnal. A họpụtara ya dịka onyeisi otu ndị Kadịnal n'afọ 2020.
Popu Francis bugoro oge ọkwa ya na Febụwarị 2025. O sonyere n'ọgbakọ conclave afọ 2005 nke họpụtara Popu Benedict XVI nakwa ọgbakọ conclave họpụtara Popu Francis n'onwa Maachị 2013
Onyeisiala Amerịka Donald Trump na nwunye Melania Trump agaala kwanyere Popu Francis ugwu ikpeazụ n’ime St Peter’s Basilica.
Foto gosiri oge Trump na nwunye ya gara hụ akpati ozu Popu Francis.
Lee oge Joe Biden chịbụru Amerịka na nwunye rutere ogige St Peter's Square iji kwanyere Popu Francis ugwu ikpeazụ
A ga-eli ozu Popu Francis na Santa Maria Maggiore bụ otu n’ime basilica anọ dị na Rome.
Ọ bụ ebe Popu Francis na-aga kwa mgbe maka ekpere ya na mmekọ ya na Mary, Nne Chukwu.
Popu Francis ga-abụ Popu mbụ a ga-eli ebe ọzọ na-abụghị ogige Vatịkan kemgbe afọ otu narị.
Ọtụtụ ndị isiala mbaụwa agbakọọla na Rome maka olili ozu Popu Francis lara mmụọ ụbọchị Easter Mọnde 21 Epre, 2025 dịka ọ gbara afọ 88.
A ga-akara ya ụka ikpeazụ na St Peter’s Basịlịka dị na Vatịkan.
Onyeisiala Yukren bụ Volodmyr Zelensky wụchiri Rọme n’ụtụtụ Satọde 26 Eprel n’agbaneghị na ọtụtụ chere na ọ kaghị ịbịa olili ozu a.
N’aka nke ọzọ, Onyeisiala Donald Trump na nwunye ya erutela Rome iji kwanyere Popu Francis ugwu ikpeazụ.
Ndị isiala ndị ọzọ a na-atụ anya ha gụnyere nwa Eze Ịngland William, Onyeisiala Emmanuel Macron na-achị Fransị, Eze mba Spen bụ Felipe VII na Lolo Letiza nakwa onyeisiala Brazil Luiz Inacio Lula da Silva.
Ndị ọzọ bụ Joe Biden na nwunye ya Jill Biden, Praịm Mịnịsta UK Keir Starmer, onyeisi otu European Commission Ursula von der Leyen, onyeisiala Filipins bụ Ferdinand Marcos Jr na onyeisiala Argentina Javier Milei.
A ga-eli ozu Popu Francis na Santa Maria Maggiore bụ otu n’ime basilica anọ dị na Rome.
Ọ bụ ebe Popu Francis na-aga kwa mgbe maka ekpere ya na mmekọ ya na Mary, Nne Chukwu.
Popu Francis ga-abụ Popu mbụ a ga-eli ebe ọzọ na-abụghị ogige Vatịkan kemgbe afọ otu narị.
A ga-ede aha ya dịka Popu n’asụsụ Latin: Franciscus n’elu ili ya