A napụla Nwaeze Andrew
aha dịka nwaeze ma napụkwa ya ụlọ obibi ya nọ na Windsor maka ebubo otu nwaanyị a kpọrọ Virginia Giuffre boro ya
na o dinara ya ugboro atọ ebe dị iche iche mgbe ọ ka bụ nwantakịrị.
Cheta na Andrew tọgbọrọ
aha eze ya na mbido ọnwa Ọktọba nke gunyere ‘Duke nke York’ dịka ndị
mmadụ na-ajụ ya ajụjụ gbasara ọ dịka ndụ ya na nzuzo.
Ezinaụlọ Giufrre chọrọ ka e mee nnyocha dị omimi gbasara ihe mere Virginia Giuffre.
Kedụ ihe atọ mere Eze Ingland ji napụ Nwaeze Andrew ugwu ya?
Julian Payne bụbụ odeakwụkwọ Eze na Ezenwaanyị Briten gwara BBC Radio 4 "ozi ọhụrụ pụtara ọhụrụ n'izu ole na ole gara aka " gbanwere ihe nile..
Andrew abụrụla nnukwu ihe na-akpasasị Ezinaụlọ Eze anya n'ọrụ ha kwesịrị ịrụ.
Kedụ ihe mere eze jiri napụ Andrew ugwu ya?
1. A hụrụ ozi imelụ(email) nke gbaghara ihe Andrew kọburu mere
2. A hụrụ akwukwọ nke Virginia Giuffre dere nke pụtara dịka ọ nwụchara
3. A hụkwara foto gosiri Jeffrey Epstein ga ọ bịara mmemme na Windsor Castle
Payne kwuru na Obieze na-agbaso obi ọha ndị mmadụ ma ghọta oge ọ dị mkpa ịnye onye ọ dịịrị ntaramahụhụ,