Ọtụtụ ndị a ma ama na gọọmenti anwụchiela Katsina steeti iji kwanyere Muhammadu Buhari ugwu ikpeazụ.
Ihe onyonyo minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Mohammed Idris wepụtara n'aka X ya, gosiri oge ya na minista ndị ọzọ rutere n'ọdọ ụgbọelu Katsina steeti dịka ha na-eche ozu Muhammadu Buhari.
A ga-eli ozu Muhammadu Buhari n’obodo ya dị na Daura,
Katsina steeti ụbọchị Tuzde Julaị 15, 2025 ma ọ kụọ elekere abụọ nke ehihe.
Ozu ya hapụrụ Lọndọn n’ụtụtụ Tuzde 15 Julaị bịawa Naịjirịa.
Onyeisiala Bola Tinubu ga-anabata ozu ya n’ogige ọdọ ụgbọelu Katsina steeti
tupu e buga ya n’obodo ya bụ Daura ebe a ga-eli ya site n’usoro okpukperechi
alakụba.
Cheta na Onyeisiala Bola Tinubu hiwere out kọmiiti ga-ahụ maka nhazi olili ozu Muhammadu Buhari. Ndị out kọmiiti ahụ bụ:
- Minista na-ahụ maka ego
- Minista na-ahụ maka ego mmefu na nhazi
- Minista na-ahụ maka nchekwa
- Minista na-ahụ maka mgbasaozi
- Minista na-ahụ maka ọrụ
- Minista na-ahụ makai he na-eme n’ime obodo
- Minista na-ahụ maka FCT
- Minista na-ahụ maka ahụike
- Minista na-ahụ maka omanaala
- Onyeisi ndị uweojii nakwa ọtụụ ndị ọzọ.
Iji kwanyere ugwu ikpeazụ zuruoke, gọọmenti etiti kwupụtara ụbọchị Tuzde 15 Julaị, 2025 dịka ụbọchị ezumike ọrụ maka olili ozu Muhammadu Buhari.